Job 42 IGBOB

1 Job we za Jehova, si,

2 Amawom na I puru ime ihe nile,Amawokwam na adighi-eb͕ochi nzube ọ bula nke sitere na Gi.

3 Ònye bu onye a nke nēzobe ndum-ọdu n'enweghi ọmuma-ihe?N'ihi ya ka m'gosiworo ihe nke m'nādighi-aghọta,Ihe dikaririm ebube, nke m'nādighi-amata.

4 Biko, nuru, mu onwem gēkwu kwa;M'gāju Gi, Gi me kwa ka m'mara.

5 Site n'ọnunu nti ka m'nuru Gi;Ma ub͕u a anyam ahuwo Gi.

6 N'ihi nka ka m'nāju onwem aju, we chèghariaN'elu ájá na ntu.

7 O rue, mb͕e Jehova gwasiri Job okwu ndia, na Jehova siri Elifaz, bú onye Timan, Iwem di ọku megide gi, megide kwa ndi-eyì-gi abua: n'ihi na unu ekwughi ihe ziri ezi bayerem, dika orùm, bú Job, kwuworo.

8 Ma ub͕u a, chirinu n'onwe-unu oke-ehi asa na ebulu asa, jekuru orùm, bú Job, surere onwe-unu àjà-nsure-ọku; Job, bú orùm, gēkpe kwa ekpere bayere unu; n'ihi na n'ezie ọ bu ya ka M'gāhu iru-ọma, ka M'ghara imeso unu dika nzuzu-unu si di; n'ihi na unu ekwughi ihe ziri ezi bayerem, dika orùm, bú Job, kwuru.

9 Elifaz, bú onye Timan, na Bildad, bú onye Shua, na Zofa, bú onye Neama, we je, me dika Jehova gwara ha: Jehova we hu Job iru-ọma.

10 Jehova me-kwa-ra ka ndọta-n'agha Job lata, mb͕e o kpere ekpere bayere ndi-eyì-ya: Jehova we tukwasi n'ihe nile Job nwere okpùkpù abua.

11 Umu-nne-ya ndikom nile, na umu-nne-ya ndinyom nile, na ndi nile mara ya na mb͕e gara aga, we biakute ya, so ya rie nri n'ulo-ya: ha we gosi ya ebere ha ji n'aru ya, kasi kwa ya obi bayere ihe ọjọ ahu nile nke Jehova mere ka ọ biakwasi ya: ha we nye ya, nwoke ọ bula otù iberibe ego, na nwoke ọ bula otù nb͕a-aka ọla-edo.

12 Ọzọ, Jehova gọziri ikpe-zu Job kari nmalite-ya, o we nwe orú nnù ewu na aturu na nnù iri-na-ise, na nnù camel iri-na-ise, na nnù ehi ise ejikọrọ abua abua, na nnù nne-inyinya-ibu abua na ọgu iri.

13 O nwe-kwa-ra umu-ndikom asa na umu-ndinyom atọ.

14 O we kpọ aha nwayi mbu, Jemaima; na aha nwayi nke-abua, Kezaia; na aha nwayi nke-atọ, Keren-hapuk.

15 Ma ahughi ndinyom, mara nma dika umu-ndinyom Job n'ala ahu nile: nna-ha we nye ha ihe-nketa n'etiti umu-nne-ha ndikom.

16 Job we di ndu mb͕e ihe a gasiri ọgu arọ asa, o we hu umu-ya, na umu umu-ya, bú ọb͕ọ anọ.

17 Job we nwua, buru agadi, ubọchi ndu-ya ju-kwa-ra ya afọ.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42