Job 11 IGBOB

1 Zofa, bú onye Neama, we za, si,

2 Àgaghi-aza ọtutu okwu?Àgāgu kwa onye eb͕ub͕ere-ọnu n'onye ezi omume?

3 Ekwukwu-Gi nile nēme ka madu b͕a nkiti;I we chìa ọchì, ma ọ dighi onye nēme ka ihere me gi.

4 I we si, Nmutam di ọcha,M'di kwa ọcha n'anya-Gi.

5 Ma otú ọ di, ọ gādim nọ̄ nma ma asi na Chineke ekwue okwu,Saghe eb͕ub͕ere-ọnu-Ya megide gi;

6 Gosi gi ihe-nzuzo nile nke amam-ihe,Na ọ di okpukpu n'izube ihe.Gi mara kwa na Chineke nēme ka echezọrọ gi ufọdu nime ajọ omume-gi.

7 Ì gēsi n'ogwugwu chọputa Chineke?Ì gāchọputa Onye Nke puru ime ihe nile rue ebe Ọ sọturu?

8 Ọ ra ka ebe di elu nile nke elu-igwe; gini ka i gēme?Ọ di omimi kari ala-mọ; gini ka i gāmara?

9 Ọtùtù-ya di ogologo kari uwa,Di kwa obosara kari oké osimiri.

10 Ọ buru na Ọ ga n'iru, mechibido madu uzọ,Kpọkọta nkpọkọta, ònye gēme kwa ka Ọ laghachi?

11 N'ihi na Ya onwe-ya mara madu efu:Ọ nāhu kwa ajọ ihe, mb͕e Ọ nādighi-elegide ya anya.

12 Ma nkpọkọrọ madu gēnwe obi,Mb͕e amuru nwa-inyinya-ibu-ọhia ka ọ buru madu.

13 Ọ buru na gi onwe-gi edozie obi-gi,We b͕asa ọbu-aka-gi abua n'ebe Ọ nọ;

14 Ọ buru na ajọ ihe adi n'aka-gi, me ka ọ di n'ebe di anya,Ekwe-kwa-la ka ajọ omume biri nulo-ikwū-gi nile;

15 N'ihi na mb͕e ahu i gēweli iru-gi nēnweghi ọlu n'aru-gi;I gābu kwa ihe siri ike dika ọla awuru awu, i gaghi-atu kwa egwu:

16 N'ihi na gi onwe-gi gēchezọ ọnọdu ọjọ gi,Dika miri nke gabigara agabiga ka i gēcheta ya:

17 Kari etiti-ehihie ka ubọchi ndu-gi gēbili kwa;Ọ buru na oké ọchichiri adi, ọ gādi ka ututu.

18 I gātukwasi kwa obi, n'ihi na olile-anya di;I gēnyocha kwa, were ntukwasi-obi dina.

19 Ọzọ kwa, i gāmakpu, ọ dighi kwa onye nēme ka i ma jijiji;Ọtutu madu gēme kwa ka iru-gi dajua.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42