1 Elifaz, bú onye Timan, we za, si,
2 Ọ̀ bu Chineke ka madu nābara n'ihe?É-è, kama onye nwere uche nābara onwe-ya n'ihe.
3 Ọ̀ nātọ Onye puru ime ihe nile utọ na i bu onye ezi omume?Ma-ọbu ọ̀ bu urù n'ebe Ọ nọ na i nēme ka uzọ-gi nile zue okè?
4 Ọ̀ bu egwu-gi kpatara O ji bara gi nba,We so gi ba n'ikpé?
5 Ìhe ọjọ gi abaghi uba?Ọ dighi kwa nsọtu diri ajọ omume-gi.
6 N'ihi na i narawo nwa-nne-gi ihe-ibe n'efu,Uwe nile nke ndi b͕a ọtọ ka i nēyipu kwa.
7 I dighi-eme ka onye nāda #mbà ṅua miri,I nēb͕ochi kwa nri n'ebe onye-agu nọ.
8 Ma nwoke nke ogwe-aka-ya di ike, ọ bu ya nwe uwa;Onye anāhu iru-ọma nēbi kwa nime ya.
9 I zipuwo ndinyom di-ha nwuru n'aka efu,Anānyaji kwa ogwe-aka nke umu-nb͕ei.
10 N'ihi ya ib͕udu di gi buruburu,Oké egwu mberede nāma kwa gi jijiji,
11 Ma-ọbu ọchichiri, nke i nādighi-ahu anya,Na njubiga miri nēkpuchi gi.
12 Chìneke anọghi n'ebe di elu nke elu-igwe?Le kwa idi-elu kpakpando, na ha di elu!
13 I we si, Gini ka Chineke mara?Ò gēsi n'azu oké ochichiri kpe ikpe?
14 Igwe-oji b͕ara ọchichiri nāburu Ya ebe-nzuzo, Ọ dighi-ahu kwa uzọ;Ọ bu kwa buruburu elu-igwe ka Ọ nējeghari.
15 Ì gēdebe uzọ ochie,Nke ndikom nēme ajọ ihe zọkwasiworo ukwu?
16 Bú ndi apunara, ma mb͕e-ha akērughi,Ndi awusiri ntọ-ala-ha dika osimiri:
17 Ndi nāsi Chineke, Si n'ebe ayi nọ wezuga Onwe-gi:Ọzọ, Gini ka Onye puru ime ihe nile gēmere ha?
18 Ma Ya onwe-ya mejuru ulo nile ha n'ezi ihe:Ma ndum-ọdu ndi nēmebi iwu di anya n'ebe m'nọ.
19 Ndi ezi omume nāhu ya, we ṅuria;Onye nēmeghi ihe ọjọ nāchì kwa ha ọchì:
20 Si, N'ezie ezopuwo ha n'uwa, bú ndi nēbili imegide ayi,Ọku eripiawo kwa ihe-ha fọduru.
21 Biko, mara Ya nke-ọma, we nọ n'udo:Nime ihe ndia ka ọdi-nma gābiakute gi.
22 Biko, nara iwu n'ọnu-Ya,Do kwa okwu-Ya nile n'obi-gi.
23 Ọ buru na i laghachikute Onye puru ime ihe nile, agēwuli gi elu dika ulo;I gēme ka ajọ omume di anya n'ebe ulo-ikwū-gi nile di.
24 Tọb͕ọ kwa àkù-gi n'elu ájá,Na ọla-edo Ofia n'etiti nkume miri-iyi;
25 Onye puru ime ihe nile gābu kwa àkù-gi,Ọla-ọcha di oké ọnu-ahia ka Ọ gābu-kwa-ra gi.
26 N'ihi na mb͕e ahu ihe nke onye puru ime ihe nile gātọ gi utọ,I gēwelite-kwa-ra Chineke iru-gi.
27 I gāriọ Ya aririọ, Ọ gānu kwa gi;I gākwughachi kwa nkwa-gi nile.
28 I gēkwubì kwa okwu, ewe me ka o guzosiere gi ike;Ìhè gāmukwasi kwa uzọ-gi nile.
29 Mb͕e ha gēme ka i di ala, i gāsi, Nweli-elu di;Onye anya-ya ruru ala ka Ọ gāzọputa kwa.