1 Emebiwo mọm, emewo ka ubọchim gwusia,Ílì dirim.
2 N'ezie ikwa-emò diyerem,Anyam nānọ kwa ọnọdu-abali n'ikpasu-obi-ilu nile ha.
3 Biko, do ihe-ibe, burum onye-mbe n'ebe Gi onwe-gi nọ;Ònye ka ọ bu, bú onye gānaram n'aka?
4 N'ihi na I zopuwo obi-ha n'inwe ezi uche:N'ihi ya I gaghi-ebuli ha elu.
5 Onye nēgosi ndi-eyì-ya inara òkè,Ọbuná anya umu-ya gādala n'isi.
6 Ọzọ, O guzowom dika ilu nke ndi nile di iche iche;Onye ha nābusa ọnu-miri n'iru-ya ka m'ghọwo-kwa-ra.
7 Anyam we nāhu inyoghi-inyoghi site na nkpasu-iwe,Ihe dim n'aru di ka onyinyo, ha nile.
8 Ibobo bayere nka gānwu ndi ziri ezi n'aru,Onye nēmeghi ihe ọjọ gākpọte kwa onwe-ya imegide onye emeruru emeru.
9 Ma onye ezi omume gējisi ike n'iso uzọ-ya,Onye nke aka-ya abua di ọcha ganāga n'iru n'iru n'inwe ume.
10 Ma otú ọ di, biko, unu nile chigharia, bia:Ma m'gaghi-achọta onye mara ihe n'etiti unu.
11 Ubọchim nile agabigawo, emebiwo nzubem nile,Bú ihe-nnweta nke obim.
12 Ha nēdo abali n'ọnọdu ehihie:Ha nāsi, Ìhè di nso iru ọchichiri.
13 Ọ buru na elem anya ala-mọ na ọ gābu ụlọm;Ọ buru na ab͕asawom utem n'ọchichiri;
14 Ọ buru na akpọwom olùlù òkù, si, Nnam ka i bu;Kpọ kwa ikpuru òkù, si, Nnem na nwa-nnem nwayi ka i bu;
15 Òle ebe kwa ka olile-anyam di ub͕u a?Olile-anyam kwa, ònye gēkiri ya?