Job 4 IGBOB

1 Elifaz, bú onye Timan, we za, si,

2 Asi na otù onye anwa igwa gi okwu, ìke gāgwu gi?Ma ònye puru ib͕ọchi onwe-ya n'ikwa okwu?

3 Le, i dọwo ọtutu madu, aka na nti,I nēme kwa ka aka nke nādighi ike di ike.

4 Okwu-gi nēme ka onye nāsu ngọngọ guzosie ike,I nāb͕a kwa ikperè nēruru ala ume.

5 Ma ub͕u a ọ nābiakute gi, ike we gwu gi;Ọ nēmetu gi aru, i we ma jijiji.

6 Ọ̀ bughi egwu-Chineke-gi bu ntukwasi-obi-gi?Ọ̀ bughi kwa izu-okè uzọ-gi nile bu olile-anya-gi?

7 Biko, cheta, ònye laworo n'iyì, mb͕e ya onwe-ya bu onye nēmeghi ihe ọjọ?Ma-ọbu òle ebe ezipuwo ndi ziri ezi?

8 Dika m'huworo anya, ndi nēgwu ajọ ihe dika ala-ubi,Ndi nāgha kwa nmeb͕u dika nkpuru-ọghigha, ha nēwe ya dika ihe-ubi.

9 Site n'iku-ume Chineke ka ha nāla n'iyì,Site kwa n'ifufe nke iwe-Ya ka anēme ka ha gwusia.

10 Ọb͕ub͕ọ-uja ọdum, na olu ọdum nāb͕ọ uja,Na ezé umu-ọdum, ka emebiworo.

11 Oke-ọdum nāla n'iyì site n'enweghi ihe ọ dọb͕utara,Umu nke nne-ọdum ekesawo kwa onwe-ha.

12 Ma mu ka ezutara okwu n'ori nye,Ntim we nara ntakwu nke sitere na ya.

13 N'èchìchè sitere n'ọhù nile nke abali,Mb͕e oké ura nādakwasi madu,

14 Oké egwu zuterem, ya na ima-jijiji,O we me ka ọtutu ọkpukpum tua oké egwu.

15 Otù mọ we gabiga n'irum;Aji anu-arum we guzo ọtọ.

16 Ọ nēguzo eguzo, ma amataghm otú ọ di n'ile ya anya;Otù udi di n'iru anyam:Idebe-ọnu-du di, ma olu ka m'nānu, si,

17 Madu, ọ̀ gābu onye ezi omume kari Chineke?Nwòke gādi ọcha kari Onye kèworo ya?

18 Le, ọbuná ndi-orù-Ya ka Ọ nādighi-atukwasi obi;Ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ nēbo ebubo na ha bu ndi-nmehie:

19 Ò gesi kwa aṅa ghara ibo kari ndi bi n'ulo urọ?Nke ntọ-ala-ha di n'ájá,Ndi anāzọpia azọpia dika nla.

20 Site n'ututu rue anyasi anētib͕u ha:Ha nāla n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi, ma ọ dighi onye nātukwasi ya obi.

21 Àdopughi udọ̀ ulo-ikwū-ha nime ha?Ha nānwu, ọ bughi kwa n'amam-ihe.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42