1 Job we za, si,
2 Ì siwo aṅa yere ya aka, bú onye nēnweghi ike?Í siwo aṅa zọputa ogwe-aka nke ume nādighi?
3 Ì siwo aṅa dua ya ọdu, bú onye nāmaghi ihe?Ì siwo kwa aṅa me ka amara nzube-ihe n'uba?
4 Ònye ka i gosiworo okwu?Ọ̀ bu kwa onye ume-ya siri nime gi puta?
5 Ndi nādighi ndu nāma jijijiN'okpuru miri na ihe nile nēbi nime ya.
6 Ala-mọ b͕a ọtọ n'iru Ya,Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ebe-ila-n'iyì nwere.
7 Ọ nēseti Ugwu n'elu ebe tọb͕ọrọ n'efu,O nēkokwasi kwa uwa n'ihe nābughi ihe.
8 Ọ nēkechi miri n'oké igwe-oji-Ya;Ma ab͕awaghi igwe-oji n'okpuru ya.
9 Ọ nējisi iru oche-eze-Ya ike,Nāb͕asa igwe-oji-Ya n'elu ya.
10 Ọ kpawo ókè buruburu n'elu miri,Rue nsọtu ìhè na ọchichiri.
11 Ogidi nile nke elu-igwe nāma jijiji,Ibobo nānwu ha site n'ibasi-nba-ike-Ya.
12 Ike-Ya ka O ji me oké osimiri ka o dere du,Nghọta-Ya kwa ka O ji tib͕u Rehab.
13 Esitere n'aka Mọ-Ya chọ elu-igwe nma;Aka-Ya adupúwo agwó nāb͕a ọsọ.