Job 41 IGBOB

1 Ì gēji nkò-azù dọrọ oké agu-iyi?Ma-ọbu ì gēji ndọ̀ biada ire-ya?

2 Ì gētiye udọ̀-ami n'imi-ya?Ma-ọbu i gēji ngu ígwè dupue àb͕à-ya?

3 Ọ̀ gāriọ gi ọtutu aririọ-amara?Ma-ọbu ọ̀ gāgwa gi okwu di nrò?

4 Ò gēso gi b͕a ndu?Ì gēwere ya ka ọ buru orù rue mb͕e ebighi-ebi?

5 Ì gēji ya gwu egwú dika nnunu?Ma-ọbu ì gēke ya ab͕u nye umu-ab͕ọghọ-gi?

6 Òtù ndi-azù, hà gēji ya zu ahia?Hà gēkè ya n'etiti ndi-ahia?

7 Ì gēji ígwè ebiri nkò maju akpukpọ-aru-ya?Ma-ọbu ì gēji ube-azù maju isi-ya?

8 Tukwasi ya ọbu-aka-gi;Cheta agha, eme-kwa-la ya ọzọ.

9 Le, nchere-ya bu ihe-ugha:Àdighi-atuda madu ọbuná n'ile ya anya?

10 Ọ dighi onye di irè nke ikpọte ya:Ònye kwa bu onye ahu nke gēguzo onwe-ya n'irum?

11 Ònye buru uzọ nyem, nke M'gākwughachi?Ihe ọ bula nke di n'okpuru elu-igwe nile, nkem ka ọ bu.

12 M'gaghi-ab͕a nkiti bayere ihe nile di ya n'aru,Ma-ọbu okwu nke idi-ike-ya, ma-ọbu ima-nma nke odudo-n'usoro-ya.

13 Ònye kpugheworo iru uwe-ya?Ònye gābà n'ab͕a-ya apiajiri okpùkpù abua?

14 Ònye gēmeghe uzọ nke iru-ya?Ezé-ya di oké ujọ buruburu.

15 Usoro nke ọta azu-ya bu npako-ya,Ha bu ihe emechiri emechi dika agāsi na eji ihe-akàrà siri ike mechi ya.

16 Dika otù si nọ ibe-ya nso,Ifufe adighi-abà n'etiti ha.

17 Anēme ka otù rapara n'aru nwa-nne-ya;Ha nējisi onwe-ha ike, agaghi-ekesa kwa ha.

18 Ize-uzere-ya nēme ka ìhè nēb͕upu,Anya-ya abua di ka mbubere-anya nke chi-ọbubọ.

19 N'ọnu-ya ka ọku-ọwa nāputa,Icheku-ọku nēwepuga kwa onwe-ha.

20 N'oghere-imi-ya abua ka anwuru-ọku nāputa,Dika nke ite anāfunwu ọku na amì nēre ere.

21 Iku-ume-ya nāmunye icheku,Ire-ọku nēsi kwa n'ọnu-ya puta.

22 N'olu-ya ka ike nwere ọnọdu-ya,Ọ bu kwa n'iru ya ka obi-ilọ-miri nēte egwú.

23 Ibewa urù anu-aru-ya rapara n'aru onwe-ha:O siri ike n'aru ya; agaghi-emeghari ya.

24 Obi-ya siri ike dika nkume;O si-kwa-ra ike dika nne-nkume-igwe-nri.

25 Mb͕e o nēbuli onwe-ya ndi di ike nātu ujọ:Site n'imebi-obi ha nēsihie uzọ.

26 Ọ buru na madu ewere mma-agha biakwasi ya, mma-agha ahu adighi-eguzosi ike;Ya na ube, na àkú, na uwe-agha.

27 Ọ nāgu ígwè n'okporo-ọka,Nāgu kwa ọla n'osisi rere ure.

28 Àkú adighi-eme ka ọ b͕alaga:Nkume èbè ab͕anweworo ya ahihia-ọka.

29 Anāgu ndele n'ahihia-ọka:Ọ nāchì kwa nkpọtu arua ọchì.

30 Okpuru-ya di ka ejùjù di nkọ:Ọ nāb͕asa dika ọ bu ihe isucha ọka n'elu apiti.

31 Ọ nēme miri di omimi ka ọ b͕ọ dika ite:Ọ nēme oké osimiri ka ọ di ka manu-otite nēsì ísì utọ.

32 Ọ nēme uzọ ka ọ nēnwuso ya;Madu gēchè na ob͕u-miri nwere isi-awọ.

33 Ọ dighi nke di ka ya n'elu ájá uwa,Nke emeworo nēnweghi ujọ.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42