Job 37 IGBOB

1 Ọzọ, obim nāma jijiji bayere nka,Ọ nēme kwa nkpatu pua n'ọnọdu-ya.

2 Genu nti nke-ọma n'ime-nkpatu nke olu-Ya,Na ntamu nke nēsi n'ọnu-Ya puta.

3 N'okputu elu-igwe nile ka Ọ nēzisa ya,Ìhè-ya dikwasi kwa akuku nile nke uwa.

4 Mb͕e ọ gasiri olu nāb͕ọ uja;Ọ nēwere olu nbili-elu-Ya ma éb͕è-elu-igwe:Ọ dighi-eb͕ochi ha mb͕e anānu olu-Ya.

5 Chineke nēji olu-Ya ma éb͕è-elu-igwe n'uzọ di ebube;Ọ nēme ihe uku, ma ayi amaghi ha.

6 N'ihi na Ọ nāsi snow,Na oké miri-ozuzo,Na oké miri-ozuzo nke miri-ozuzo-Ya di ike, Di n'ala.

7 Ọ nākachi aka madu ọ bula akàra;Ka madu nile O mere we mara ya.

8 Anu-ọhia we nābà n'ọ̀té-ya,Ọ nānọdu kwa n'ebe-obibi-ya.

9 N'ime-ulo Ndida ka oké ifufe nēsi bia:Ọ bu kwa n'Ugwu ka oyi nēsi bia.

10 Anēsi n'iku-ume Chineke nye ice:Anēme kwa obosara miri ka ọ di warara.

11 Ọzọ, O nēji miri-ozuzo bob͕u oké igwe-oji;Ọ nāb͕asa igwe-oji nke ìhè-Ya:

12 Anēchighari kwa nke ahu buruburu site n'okpukpe-Ya,Ka ha we me ihe ọ bula nke Ọ nēnye ha n'iwuN'elu-uwa dum madu bi:

13 Ma ọ bu n'ihi nkpa-n'aka, ma-ọbu n'ihi uwa-Ya,Ma-ọbu n'ihi ebere, ka Ọ nēme ka ọ biarue.

14 Ṅa nti na nka, Job:Guzo, ghọta oké ọlu nile nke Chineke.

15 Ì mara otú Chineke nēnye ha iwu,Nēme kwa ka ìhè igwe-oji-Ya mua?

16 Ì mara otú oké igwe-oji ji kwuru efekefe,Oké ọlu nke Onye zuru okè n'ọmuma-ihe?

17 Gi onye uwe-gi nēkpo ọku,Mb͕e Ọ nēme ka uwa di jū site n'ifufe Ndida.

18 Ì gēso Ya me ka mbara-ígwé nile sa mbara,Nke di ike dika enyo awuru awu?

19 Me ka ayi mara ihe ayi gāsi Ya;Ayi adighi-edo okwu-ayi n'usoro n'ihi ọchichiri.

20 Àgākọrọ Ya na m'gēkwu okwu?Ma-ọbu ọ̀ di madu ọ bula siri ka eloda ya?

21 Ma ub͕u a madu ahughi ìhè nke nēb͕upu na mbara-ígwé:Ifufe we gabiga, me ka ha di ọcha.

22 N'Ugwu ka ọla-edo, bú ọmùmù-ìhè, nēsi bia:Chineke ka ebube di egwu nādikwasi.

23 Onye puru ime ihe nile, ayi achọputaghi Ya; Ọ di uku n'ike:N'ikpe na iba-uba nke ezi omume Ọ dighi-eweda n'ala.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42