Job 28 IGBOB

1 N'ihi na ebe ọla-ọcha si aputa di,Na ebe nke diri ọla-edo ahu ha nānucha anucha.

2 Anēsi n'ájá eweputa ígwè,Anāwu kwa nkume ighọ ọla.

3 Madu emewo ọchichiri ka o nwe ọgwugwu,Rue nsọtu nile ka ya onwe-ya nēgwuputa kwaNkume nke oké ọchichiri na onyinyo ọnwu.

4 O siwo n'ebe madu nọ dika ọbìa tua ọnu;Ha bu ndi ukwu nke nāga aga nēchezọ;Anākwuba ha udọ̀ n'ebe di madu anya, ha nākwufeghari.

5 Ala, nime ya ka nri si aputa:Ma n'okpuru ya ka atughariworo ya dika ọ bu ọku mere ya.

6 Ọnọdu sapphire ka nkume-ya nile bu,Ọ nwe-kwa-ra ájá ọla-edo.

7 Ọ bu uzọ nke udele nāmaghi,Anya agu-nkwọ ahughi kwa ya:

8 Anu-ọhia di nganga azọghi ya ukwu,Ọdum nāb͕ọ uja agabigaghi kwa n'elu ya.

9 Oké nkume ọmu ka o setipuworo aka-ya imegide;Okpùwo ugwu iru site na nkpọrọgwu-ha.

10 N'oké nkume nile ka ọ waputaworo uzọ miri si erù;Anya-ya ahuwo kwa ihe ọ bula di oké ọnu-ahia.

11 O kechiwo osimiri ka ha ghara itu miri;Ihe-nzuzo ka ọ nēme kwa ka ọ puta ìhè.

12 Ma amam-ihe, òle ebe agāchọputa ya?Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta?

13 Madu amaghi ọ̀rùrù-ọnu-ya;Agaghi-achọta kwa ya n'ala ndi di ndu.

14 Ob͕u-miri siri, Ọ bughi nimem ka ọ di:Oké osimiri si-kwa-ra, Ọ dighi n'akam.

15 Adighi-enye ọla-edo makarisiri nma n'ọnọdu ya,Adighi-atù kwa ọla-ọcha ibu ọnu-ahia-ya.

16 Adighi-eji ọla-edo ọma nke Ofia,Adighi-eji kwa onyx di oké ọnu-ahia, ma-ọbu sapphire, tù ya.

17 Adighi-ewere ọla-edo na enyo turu ya:Ihe ọla-edo anuchara anucha abughi kwa ihe-nb͕anwe-ya.

18 Agaghi-ehota coral na crystal:E, nnweta amam-ihe kariri ruby.

19 Adighi-ewere topaz nke Etiopia turu ya,Adighi-eji ọla-edo ọma anāgwaghi agwa tù ya.

20 Ma amam-ihe, òle ebe o si bia?Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta?

21 N'ihi na ezonariwo ya n'anya ihe nile di ndu,Esiwo kwa n'anu-ufe nke elu-igwe zopu ya.

22 Ebe-ila-n'iyì na ọnwu siri,Na nti-ayi ka ayi nuworo akukọ-ya.

23 Chineke aghọtawo uzọ-ya,Ya onwe-ya amawo kwa ọnọdu-ya.

24 N'ihi na Ya onwe-ya nēlegide ihe anya rue nsọtu nile nke uwa,N'okpuru elu-igwe nile ka Ọ nāhu ihe;

25 Imere ifufe ihe-ọtùtù;Miri ka Ọ tùwo-kwa-ra n'ọtùtù.

26 Mbe Ọ tọrọ ukpuru nye miri-ozuzo,Dozi kwa uzọ nye àmùmà nke éb͕è-elu-igwe:

27 Mb͕e ahu ka Ọ huru ya, we kọ akukọ-ya;O mere ka o guzosie ike, O gwuputara ala-ya.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42