1 Job we malite itu ilu-ya ọzọ, si,
2 Chineke nādi ndu, Onye wezugara ikpém;Onye puru ime ihe nile nādi kwa ndu, bú Onye mere ka nkpuru-obim di ilu;
3 (N'ihi na ogologo mb͕e nile umem di nimem,Mọ nke Chineke di kwa n'imem;)
4 N'ezie eb͕ub͕ere-ọnum adighi-ekwu okwu ajọ omume,Irem adighi-atamu kwa ntamu aghughọ.
5 Ya burum ihe-árú ọ buru na aguam unu na ndi ezi omume:Rue mb͕e m'kubìri ume m'gaghi-esi n'ebe m'nọ wezuga izu-okèm.
6 Ezi omumem ka m'jideworo, m'gaghia ara kwa ya aka:Obim adighi-atam uta bayere otù n'ubọchim nile.
7 Ka onye-irom di ka onye nēmebi iwu,Ka onye nēbili imegidem di kwa ka onye ajọ omume.
8 N'ihi na gini bu olile-anya onye emeruru emeru, mb͕e Chineke nēbipu ya,Mb͕e Chineke nēsepu nkpuru-obi-ya?
9 Chineke, Ọ̀ gānu iti-nkpu-ya,Mb͕e nkpab͕u nābiakwasi ya?
10 Ìhe nke Onye puru ime ihe nile gātọ ya utọ?Ọ̀ gākpọku Chineke na mb͕e nile?
11 M'gēzí unu ihe site n'aka Chineke;M'gaghi-ezobe ihe nke di n'aka Onye puru ime ihe nile.
12 Le, unu onwe-unu nile ahuwo ya;N'ìhi gini kwa ka unu nāghọsi ihe-efu?
13 Nka bu òkè madu nēmebi iwu n'ebe Chineke nọ,Na ihe-nketa nke ndi nēme ka madu ma jijiji, nke ha nānara n'aka Onye puru ime ihe nile.
14 Ọ buru na umu-ya amuba, ọ bu inye mma-agha;Umu nke putara n'aru-ya agaghi-eriju kwa nri afọ.
15 Agēli ndi-ya fọduru n'ọnwu,Ndinyom-ya di-ha nwuru agaghi-akwa ákwá.
16 Ọ buru na ọ kwakọba ọla-ọcha dika ájá,Dozie uwe dika urọ;
17 O gēdozi ya, ma onye ezi omume gēyi ya,Onye nēmeghi ihe ọjọ gēkè kwa ọla-ọcha.
18 O wuwo ulo-ya dika nla,Na dika ulo-ntu nke onye-nche meworo.
19 O nēdina buru ọgaranya, ma agaghi-achikọta ya;Ọ saghewo anya ya abua, ma ọ nọghi.
20 Ihe-egwu nēru ya aru dika miri;Oké ifufe ezupuwo ya n'abali.
21 Ifufe Iru-anyanwu nēburu ya, o we la;O we fechapu ya n'ọnọdu-ya.
22 Chinke gātu kwa ya ihe, ghara kwa inwe ọmiko n'aru-ya:N'aka-Ya ka o gēsi b͕alaga ab͕alaga.