Job 40 IGBOB

1 Jehova we za Job, si,

2 Onye nādọ aka na nti, ọ̀ nālusoOnye puru ime ihe nile ọ̀gù?Onye nābara Chineke nba, ya za ya.

3 Job we za Jehova, si,

4 Le, abum onye elelìworo; gini ka m'gāzaghachi Gi?Atukwasiwom, akam, n'ọnum.

5 Otù ub͕ò ka m'kwuworo okwu, m'gaghi-aza kwa;E, ub͕ò abua, ma m'gaghi-aza kwa ọzọ.

6 Jehova we si n'oké ifufe za Job, si,

7 Biko, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi dika onye di ike:M'gāju gi, gi me kwa ka M'mara.

8 Ì nēmebi kwa ikpém?I nāmam ikpe, ka i we buru onye ezi omume?

9 Ma-ọbu ọ̀ bu ogwe-aka dika Chineke ka i nwere?Ọ̀ bu kwa olu dika Ya ka i gēji ma dika éb͕è-elu-igwe?

10 Biko, were nbili-elu na idi-elu chọ onwe-gi nma;Were kwa ebube na ima-nma yikwasi onwe-gi.

11 Wusa nrubiga-ókè nke iwe-gi:Hu kwa onye-npako ọ bula, me ka ọ di ala.

12 Hu onye-npako ọ bula, me ka o ruru ala;Zọpia kwa ndi nēmebi iwu n'ọnọdu-ha.

13 Zobekọ ha n'ájá;Kechie iru-ha n'ebe zoro ezo.

14 Emesia Mu onwem gēkele kwa gi,Si na aka-nri-gi nāzọputa gi.

15 Biko, le otobo, nke M'kèworo gi na ya;Ọ nāta ahihia dika ehi.

16 Biko, le, ike-ya di n'úkwù-ya,Ume-ya di kwa n'akwara nile nke afọ-ya.

17 Ọ nārọgọba ọdùdù-ya dika osisi cedar:Akpọwo akwara utaku-ukwu-ya.

18 Ọkpukpu-ya nile di ka ogidi ọla nwere umi;Ọgiriga-ya di ka nkpọro ígwè.

19 Ya onwe-ya bu nmalite uzọ nile nke Chineke:Onye meworo ya nēweta mma-agha-ya nso.

20 N'ezie ihe-ọmume ka ugwu nēbutere ya;Bú ebe anu-ọhia nile nēgwuli egwú.

21 N'okpuru osisi lotus ka ọ nēdina,N'ebe nzuzo nke amì, na apiti.

22 Osisi lotus nēji ǹdò-ha b͕ochie ya;Osisi willow nke miri-iyi di ya buruburu.

23 Le, osimiri nērùsi ike, ọ dighi-ama jijiji:Ọ nātukwasi obi, mb͕e Jọdan nāwaputa rue ọnu-ya.

24 Ànējide ya mb͕e ọ nēle anya?Ma-ọbu ànēwere ọnyà mapue imi-ya?

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42