Job 5 IGBOB

1 Biko, kpọ òkù; ọ̀ di onye nāza gi?Ònyè n'etiti ndi nsọ ka i gēche kwa iru?

2 N'ihi na nkpasu-iwe nēb͕u onye b͕agọro ab͕ago n'uche-ya,Ekworo nēme kwa ka onye nenweghi uche nwua.

3 Mu onwem ahuwo onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka ọ nāb͕a ngbọrọgwu:M'we bua ebe-obibi-ya ọnu na mberede.

4 Umu-ya nānọpu anya n'ebe nzọputa di,Ewe zọpia ha n'ọnu-uzọ-ama,Ọ dighi kwa onye nānaputa ha.

5 Onye onye-agu nēripia owuwe-ihe-ubi-ya,Nēsi kwa ọbuná n'ogwu were ya,Ọnyà nēkusi ume ike inwe àkù-ha.

6 N'ihi na ajọ ihe adighi-esi n'ájá puta,Ọ bughi kwa n'ala ka ọnọdu ọjọ si epuputa;

7 Kama anāmuputa madu nye ọnọdu ọjọ,Dika icheke-ọku nile nēfeli elu.

8 Ma mu onwem, m'gāchọ Chineke,Chineke ka m'gēbo kwa okwum:

9 Onye nēme ihe uku, nke ngwuputa ala-ha nādighi;Oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu adigh:

10 Onye nēnye miri-ozuzo n'elu ala,Nēziga kwa miri n'elu ebe di n'èzi:

11 Ido ndi di ala n'ebe di elu;Ndi nēyi uwe-nkpe nọ kwa n'elu nime nzọputa.

12 Ọ nēmebi èchìchè nile nke ndi-aghughọ,Aka-ha adighi-eme kwa ihe ha zubere.

13 Ọ nējide ndi mara ihe n'aghughọ-ha:Ndum-ọdu nke ndi nāb͕a nb͕a me-kwa-ra ngwa.

14 N'ehihie ka ha nēzute ọchichiri,Ha nāsọghari kwa ìsì n'etiti-ehihie, dika n'abali.

15 O we zọputa madu na mma-agha nke sitere n'ọnu-ha,Bú ndi-ob͕eye n'aka ndi di ike.

16 Onye nēnweghi ike we nwe olile-anya,Ma ajọ omume ekpuchiwo ọnu-ya.

17 Le, onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu, onye Chineke nābara nba:Aju-kwa-la idọ-aka-na-nti nke Onye puru ime ihe nile.

18 N'ihi na Onye ahu nēme ka ihe b͕ue nb͕u,Ọ nēké kwa eke; O nētib͕u, aka-Ya nēme kwa ka adiri ndu.

19 Nime nkpab͕u isi ka Ọ gānaputa gi;Ọzọ, n'asa ihe ọjọ agaghi-emetu gi aru.

20 N'oké unwu Ọ b͕aputawo gi n'ọnwu;B͕aputa kwa gi n'aka mma-agha n'agha.

21 Mb͕e ire nāpia utari agēzo gi;I gaghi-atu kwa egwu ihe-ike mb͕e ọ nābia.

22 I gāchì ihe-ike, chì kwa agu, ọchì;I gaghi-atu kwa egwu anu-ọhia nke uwa.

23 N'ihi na gi na nkume ọhia nile gādi n'ọb͕ub͕a-ndu;Gi na anu ọhia gādi kwa n'udo.

24 I gāma kwa na ulo-ikwū-gi di n'udo;I gēlekọta kwa ebe-obibi-gi, i gaghi-emehie kwa.

25 I gāma kwa na nkpuru-gi di ọtutu,Umu nke putara n'aru-gi gādi kwa ka ihe-ọkukú nke ala.

26 I gābia n'ílì n'ezib͕o agadi,Dika obo ọka si ala elu na mb͕e-ya.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42