Job 20 IGBOB

1 Zofa, bú onye Neama, we za, si,

2 N'ihi nka ka èchìchèm nāzaghachim,Ọbuná n'ihi ime-ngwam nke di nimem.

3 Anuwom ọdidọ-aka-na-nti nke nētiyem n'ọnọdu-ihere,Mọ nke nghọtam nāzakwam.

4 Ì mawo nka site na mb͕e ochie,Site na mb͕e edoro madu n'elu uwa,

5 Na iti-nkpu-ọǹù nke ndi nēmebi iwu di nkpunkpu,Na ọṅù nke onye emeruru emeru nādi kwa rue mb͕e ntabi-anya?

6 Ọ buru na nbuli-ya arigorue elu-igwe,Isi-ya ewe metu igwe-oji;

7 Dika ǹsí-ya ka ọ gāla n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi:Ndi huworo ya gāsi, Òle ebe ọ nọ?

8 Dika nrọ ka ọ gēfelaga, agaghi-achọta kwa ya:Agēme kwa ka o fepu dika ọhù abali.

9 Anya ahuwo ya, ma ọ gaghi-ahu kwa ya ọzọ;Ọnọdu-ya agaghi-ekiri kwa ya ọzọ.

10 Umu-ya gāchọ iru-oma ndi-ob͕eye,Aka-ya abua gēnyeghachi kwa àkù-ya.

11 Ọkpukpu-ya nile juputara n'ume okorọbia-ya,Ma o gēso ya dina n'elu ájá.

12 Ọ buru na ihe ọjọ atọ utọ n'ọnu-ya,Ọ buru na o zobe ya n'okpuru ire-ya;

13 Ọ buru na o nwe ọmiko n'aru ya, we ghara irapu ya,Kama ọ nēb͕ochi ya nokpo-ọnu-ya;

14 Nri-ya nke di na ngiri-afọ-ya ab͕anwewo,Ọ bu òlùlù aju-ala n'ime-ya.

15 O lodawo àkù, we b͕oputa ya:Chineke gēsi n'afọ-ya napu ya àkù ahu.

16 Nsi aju-ala ka ọ gāmiri:Ire agwọ gēb͕u ya.

17 Ọ gaghi-ele miri-iyi anya,Bú osimiri miri-iyi nke manu-aṅu na miri-ara-ehi raru araru.

18 Ọ nēnyeghachi ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inwe, ọ gaghi-eleda ya;Dika àkù nke ihe-nb͕anwe-ya si di, ọ gaghi-aṅuri ọṅu otú a.

19 N'ihi na ọ zopiawo ndi-ob͕eye, rapu kwa ha;Ọ napuwo ulo n'ike, ọ gaghi-ewu kwa ya.

20 N'ihi na ọ dighi-ama udo n'afọ-ya,Ya mere ọ gaghi-eji ihe-ya anāchọsi ike wepuga onwe-ya.

21 Ọ dighi ihe fọduru nke ọ nērighi;N'ihi ya ọdi-nma-ya agaghi-adi ike.

22 N'ojuju nke ozùzù-ya nkpà nākpà ya:Aka onye ọ bula nke nọ n'ọnọdu ọjọ gābiakwasi ya.

23 Ka o rue, n'iriju afọ-ya,Na Chineke gēzitere ya idi-ọku nke iwe-Ya,Na Ọ gēme kwa ka o zokwasi ya dika miri-ozuzo nime nri-ya.

24 Ọ gēsi n'ihe-ekike-agha ígwè b͕alaga,Uta ọla gāb͕apue ya.

25 Ọ dọputawo ya, o we si n'aru-ya puta:Ọnu-ọnu-ya nke nēb͕upu àmùmà nēsi kwa n'òlùlù-ya puta;Oké ujọ nile di n'aru ya.

26 Ọchichiri nile ka ezobeworo ibu ihe-ya atukobara atukọba:Ọku nke anāfunwughi afunwu gēripia ya;Ọ gērechapu ihe fọduru n'ulo-ikwū-ya.

27 Elu-igwe gēkpughe ajọ omume-ya,Ala nēbili kwa imegide ya.

28 Agēme ka ihe-omume nke ulo-ya je biri n'ala ọzọ,Àkù-ya bu ihe anāwusi awusi n'ubọchi iwe-Ya.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42