Job 9 IGBOB

1 Job we za, si,

2 N'ezie amawom na ọ di otú a:Ma madu, ò gēsi aṅa buru onye ezi omume n'iru Chineke?

3 Ọ buru na ọ tọ ya utọ iso Ya je n'ikpé,Ọ gaghi-aza Ya otù okwu nime nnù okwu abua na ọgu iri.

4 O nwere obi nke mara ihe, Ọ nāb͕a kwa ume n'ike:Ònye mere onwe-ya ka o sie ike imegide Ya, we nọ n'udo?

5 Onye nākwapu ugwu, ma ha amaghi ya,Mb͕e Ọ kwatuworo ha n'iwe-Ya.

6 Onye nēme ka uwa me nkpatu pua n'ọnọdu-ya,Ogidi-ya nile we ma jijiji.

7 Onye nāgwa anyanwu okwu, o we ghara iwa;Ọ nākachi kwa kpakpando akàrà.

8 Onye nání Ya nēseti elu-igwe,Nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke oké osimiri ukwu.

9 Onye nēme Bear, na Orion, na Pleiades,Na ime-ulo nke Ndida.

10 Onye nēme ihe uku, rue mb͕e ngwuputa ala-ha nādighi;Na oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu nādighi.

11 Le, Ọ nāgabiga n'akukum, ma adighm-ahu Ya:Ọ nāga kwa n'iru, ma adighm-amata Ya.

12 Le, Ọ nānwude ihe, ònye gēme ka Ọ laghachi azu?Ònye gāsi Ya, Gini ka I nēme?

13 Chineke agaghi-eme ka iwe-Ya laghachi;Ndi nēyere Rehab aka ruru ala n'okpuru Ya.

14 Mù onwem gēsi kwa aṅa za Ya,Rọputa kwa okwum nile m'gāgwa Ya?

15 Onye, ọ buru na abum onye ezi omume, m'gaghi-aza Ya;Kama m'gāriọ onye nēkpem ikpe aririọ-amara.

16 Ọ buru na m'kpọwo òkù, O we zam;M'gaghi-ekwe kwa na Ọ ṅara nti n'olum;

17 Bú Onye nēji oké ifufe chifiam aru,Onye nēme kwa ka ob͕ub͕u-mmam, bú nke eb͕urum, ba uba n'efù.

18 Ọ gaghi-ekwem ka m'turu ndu,Kama Ọ nēme ka afọ jum n'ihe-ilu nile.

19 Ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ike nke onye nwe ume, le, Ọ nọ ya!Ma ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ikpé, ònye gākaram mb͕e?

20 Ọ buru na abum onye ezi omume, ọnum gāmam ikpe:Onye zuru okè ka m'bu, o we si na abum onye b͕agọrọ ab͕agọ.

21 Onye zuru okè ka m'bu; adighm-amara nkpuru-obim;Ajum ndum.

22 Otù ihe aju ka ọ bu; n'ihi ya ka m'siri,Onye zuru okè na onye nēmebi iwu ka Ya onwe-ya nēme ka ha gwusia.

23 Ọ buru na utari eme ka madu nwua n'otù ntabi-anya,Ọ gāchì onwunwa onye nēmeghi ihe ọjọ ọchì.

24 Enyewo uwa n'aka onye-nmehie:Ọ nēkpuchi iru ndi-ikpe-ya;Ọ buru na ọ bughi Ya, ònye kwa ka ọ bu?

25 Ma ubọchim nile di garagara kari ọb͕a-ọsọ:Ha ab͕alagawo, ha ahughi ezi ihe.

26 Ha agabigawo n'iru dika ub͕o amì:Dika ugo si efedakwasi ngwa ngwa n'anu ọ gēri.

27 Ọ buru na asim, Ka m'chezọ ntamum,Ka m'rapu iru ujọm, b͕asa irum:

28 Anamatu ujọ ihe-nb͕um nile,Amawom na I gaghi-agum n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

29 Agama mu onwem ikpe;N'ìhi gini kwa ka m'dọb͕uru onwem n'ọlu n'efu?

30 Ọ buru na ewerem miri snow sa arum,Were kwa nchà me ka ọbu-akam abua di ọcha;

31 Mb͕e ahu I gābiayem n'olùlù,Uwem gākpọkwam ihe-árú.

32 N'ihi na Ọ bughi madu, otú m'bu, na m'gāza Ya,Na ayi gābiakota n'ikpé.

33 Ọ dighi odozi-okwu di n'etiti ayi,Nke gātukwasi ayi abua aka-ya.

34 Ya wezuga nkpa-n'aka-Ya n'arum,Ka oké ujọ-Ya ghara ime ka m'tua egwu nke-uku:

35 Ka m'kwue okwu, ghara itu egwu Ya;N'ihi na ọ bughi otú a ka m'di n'ebe mu onwem nọ.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42