1 Ndikom atọ ndia we kwusi iza Job, n'ihi na ya onwe-ya bu onye ezi omume n'anya-ya.
2 Iwe Elaihu nwa Barakel, bú onye Buz, site n'ab͕uru Ram, we di ọku: megide Job ka iwe-ya di ọku, n'ihi na ọ guru onwe-ya n'onye ezi omume kari Chineke.
3 Ọzọ, megide ndi-eyì-ya atọ ka iwe-ya di ọku, n'ihi na ha achọtaghi ihe-ọziza ha gēji ma Job ikpe.
4 Ma Elaihu chere Job n'ikwu okwu, n'ihi na ndi-okenye ka ha bu kari ya onwe-ya n'ubọchi ndu-ha.
5 Elaihu we hu na ihe-ọziza adighi n'onu ndikom atọ ahu, iwe-ya we di ọku.
6 Elaihu nwa Barakel, bú onye Buz, we za, si,Nwata ka m'bu n'ubọchi ndum, ma unu onwe-unu bu ndi kara nká;N'ihi ya ka m'rapuru, we tua egwu ikwuputara unu ihe m'mara.
7 Asirim, Ubọchi bara uba gēkwu okwu,Ọtutu arọ gēme kwa ka amara amam-ihe.
8 N'ezie mọ di nime madu,Iku-ume nke Onye puru ime ihe nile nēme kwa ka ha ghọta ihe.
9 Ọ bughi ndi uku mara ihe,Ọ bughi kwa ndi-okenye nāghota ikpé.
10 N'ihi nka ka m'siri, Gem nti;M'gēkwuputa ihe m'mara, ọbuná mu onwem.
11 Le, echerem okwu-unu,Anamaṅa nti nghọta-unu,Rue mb͕e unu gēgwuputa ala okwu nile.
12 E, anamelekwasi unu anya,Ma, le, ọ dighi onye nēso Job ru uka,Ma-ọbu nke nāza okwu-ọnu-ya nile, n'etiti unu.
13 Lezienu anya ka unu ghara isi, Ayi achọtawo amam-ihe;Chineke gāchipu ya, ọ bughi madu:
14 N'ihi na o doghi okwu-ya n'usoro imegidem;M'gaghi-eji kwa okwu-ọnu-unu zaghachi ya.
15 Ha atuwo ujọ, ha azaghi kwa ọzọ:Ha ewepuwo okwu nile n'ọnu onwe-ha.
16 M'gēcheta kwa, n'ihi na ha adighi-ekwu,N'ihi na ha eguzowo, ghara iza ọzọ?
17 M'gāza òkèm, ọbuná mu onwem,M'gēkwuputa ihe m'mara, ọbuná mu onwem.
18 N'ihi na ejuputaram n'okwu;Mọ nke di n'afọm akpab͕uwom.
19 Le, afọm di ka manya-vine nke anākwupughi akwupu;Dika karama-akpukpọ ọhu, ọ nāb͕awa ab͕awa.
20 Ka m'kwue, ka aru we dajuam;M'gēmeghe eb͕ub͕ere-ọnum, za.
21 Biko, ka m'ghara ihu nwoke ọ bula iru-ọma;M'gaghi-etu kwa madu aha.