Job 36 IGBOB

1 Elaihu we nēkwu kwa, si,

2 Cherem nwa mb͕e ntà, m'gēkwuputa-kwa-ra gi;N'ihi na okwu ọzọ di ikwuru Chineke.

3 M'gēsi n'ebe di anya bute ọmuma-ihem,Ọ bu kwa Onye kpurum ka m'gēnye ezi omume.

4 N'ihi na n'ezie ọ bughi okwu-ugha ka okwum nile bu:Onye zuru okè n'ọmuma-ihe nọyere gi.

5 Le, Chineke di ike, Ọ dighi-aju kwa onye ọ bula:Ọ di ike n'ike nke obi.

6 Ọ dighi-edebe ndu nke onye nēmebi iwu:Ma Ọ nēnye ndi ewedara n'ala ezi ikpé.

7 Ọ dighi-esepu anya-Ya n'aru onye ezi omume:Ma ọbuná n'ebe ndi-eze nọ n'oche-ezeKa Ọ nēme ka ha nọkwasi rue mb͕e ebighi-ebi, ha we di elu.

8 Ma ọ buru na ejide ha n'udọ̀ nke nweda-n'ala,Dika ndi ekeworo ab͕u nime nkpọrọ-ukwu;

9 O we nēgosi ha ọlu-ha,Na njehie nile ha, na ha nēme onwe-ha ndi di ike megide Ya.

10 O nēkpughe kwa nti-ha idọ ha aka na nti,Ọ si ha si n'ajọ ihe laghachi.

11 Ọ buru na ha anu, we fè Ya òfùfè,Ha gēme ka ubọchi nile ha gwusia n'ọdi-nma,Me kwa ka arọ nile ha gwusia n'ihe-utọ.

12 Ma ọ buru na ha adighi-anu ha gāla n'iyì site n'ihe-agha,Kubìe ume nēnweghi ọmuma-ihe.

13 Ma ndi emeruru obi-ha emeru nēdo iwe n'obi:Ha adighi-etiku Chineke mb͕e O keworo ha ab͕u.

14 Nkpuru-obi-ha nānwu na nwata,Ndu-ha nāla kwa n'iyì n'etiti ndi edoro nsọ ikwa iko.

15 Ọ nādọputa onye ewedara n'ala na nweda-n'ala-ya.Ọ nēkpughe kwa nti-ha nime nmeb͕u.

16 Ọbuná otú a ka Ọ ràraworo gi isi n'ọnu nkpab͕uBa n'ebe sara mbara, nke ebe di nkpa nādighi n'okpuru ya;Ndọba ihe-oriri nke table-gi gējuputa kwa n'abuba.

17 Ma i juputawo n'okwu-ikpé nke onye nēmebi iwu:Okwu-ikpé na ezi ikpé nējide gi.

18 N'ihi na lezie anya ka ọnuma ghara irafu gi site n'otiti-ihe;Ekwe-kwa-la ka iba-uba nke ihe-nb͕aputa wezuga gi.

19 Ọ̀ gēdo àkù-gi n'usoro ka i ghara inọ na nkpà?Ma-ọbu ume nile nke ike-gi?

20 Ekusila ume ike ibiaru abali,Bú mb͕e ndi di iche iche nārigo n'ọnọdu-ha.

21 Lezie anya, echela ajọ ihe iru:N'ihi na nka ka i rọputaworo kari nweda-n'ala.

22 Le, Chineke nēme Onwe-ya ka Ọ nọ n'elu n'ike-Ya:Ònye bu onye-ozizí dika Ya?

23 Ònye wereworo uzọ-Ya leta Ya?Ma-ọbu ònye siworo, I mewo ajọ omume?

24 Cheta ka i me ọlu-Ya ka ọ di uku,Bú nke madu bùworo abù bayere ya.

25 Madu nile elewo ya anya;Madu nēlegide ya site n'ebe di anya.

26 Le, Chineke di uku, ayi amaghi kwa Ya;Ọnu-ọgugu arọ-Ya enweghi kwa ngwuputa.

27 N'ihi na Ọ nēsepu nkpuru miri,Nke nāghọ miri-ozuzo diri alulu-Ya:

28 Nke mbara-ígwé nāwuda, nātasa madu n'uba.

29 Ọzọ, ọ̀ di onye nāghọta nb͕asa igwe-ojiNbib͕ọ nke ulo-ntu-Ya?

30 Le, Ọ b͕asawo ìhè-Ya n'elu ya;Ebe dikarisiri omimi nke oké osimiri ka O kpuchiwo-kwa-ra.

31 N'ihi na ndia ka O ji nēkpe ndi nile di iche iche ikpe;Ọ nēnye ihe-oriri n'uba.

32 Ọ jiwo ìhè kpuchi ọbu-aka-Ya abua;We nye ya iwu imegide onye nēmegide Ya.

33 Nkpọtu-ya nēgosi ihe bayere Ya,Gosi kwa anu-ulo ihe bayere Onye nārigo.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42