Job 7 IGBOB

1 Ọ̀ dighi obubu-agha diri madu n'elu uwa?Ùbọchi-ya adighi ka ubọchi onye egoro ọlu?

2 Dika orù si ekusie ume ike ibà n'okpuru ǹdò,Na dika onye egoro ọlu si ele anya ugwọ-olu-ya:

3 Otú a ka emeworom ha m'keta ọtutu ọnwa nke ihe-efu,Ọtutu abali nke m'nādọb͕u onwem n'ọlu ka ha gutawo-kwa-ra nyem.

4 Ọ buru na edinam, m'si,Òle mb͕e m'gēbili? ma anyasi esetiwo onwe-ya;Afọ ejuwokwam na ntugharim rue chi-ọbubọ.

5 Anu-arum nēyi ikpuru na ob͕e ájá;Akpukpọ-arum atawo ata, we b͕aze.

6 Ubọchim di garagara kari ọ́kpà eji kpa ákwà,Ha we gwusia nenweghi olile-anya.

7 Cheta na ndum bu ifufe:Anyam agaghi-alaghachi ihu ezi ihe.

8 Anya onye nāhum agaghi-ekirim:Anya-Gi gādi n'arum, ma m'gaghi-adi.

9 Dika igwe-oji si agwusi, we la,Otú a onye nārida n'ala agaghi-arigota.

10 Ọ gaghi-alata n'ulo-ya ọzọ,Ebe-ya agaghi-amata kwa ya ọzọ.

11 Mu onwem kwa, m'gaghi-eb͕ochi ọnum;Ka m'kwue nime nkpab͕u nke mọm;Ka m'tamue ntamu n'idi-ilu nke nkpuru-obim.

12 Ọ̀ bu oké osimiri ka m'bu, ma-ọbu ogologo anu nke di n'oké osimiri,Na I nēdo ndi-nche ichem?

13 Mb͕e m'siri, Ihe m'ji dina gākasim obi,Ihe-ndinam gēbupu ntamum;

14 I we were nrọ me ka m'tua ujọ,I site-kwa-ra n'ọhù me ka m'tua egwu nke-uku:

15 Nkpuru-obim we rọputa ntọb͕u,Na ọnwu kari ọkpukpum ndia.

16 Ajuwom ndu; m'gaghi-adi ndu rue mb͕e ebighi-ebi:Rapum; n'ihi na otù nku-ume ka ubọchim nile bu.

17 Gini ka madu bu, na I nēme ya ka ọ di uku,Na I nātukwasi kwa ya obi-Gi,

18 Na I nēleta kwa ya ututu nile,Na I nānwaputa ya na mb͕e dikarisiri ntà nile?

19 Rùe ole mb͕e ka I nāgaghi-elepum anya,Ka I nāgaghi-arapum rue mb͕e m'lodara ọnu-mirim?

20 Asi na emehiewom, gini ka m'nēme Gi, Gi Onye nēche madu?N'ìhi gini ka I doworom ibu ihe-ndakwasi n'ebe I nọ,M'we ghọrọ onwem ibu?

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42