Job 38 IGBOB

1 Jehova we si n'oké ifufe za Job, si,

2 Ònye bu onye a nke nēme ka ndum-ọdu b͕a ọchichiriSite n'okwu ọmuma-ihe nādighi?

3 Biko, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi dika onye di ike:M'gāju kwa gi, gi me kwa ka M'mara.

4 Òle ebe i nọ mb͕e M'tọro ntọ-ala uwa?Gosim, ma ọ buru na i mara nghọta.

5 Ònye doro ọtùtù-ya nile, ma asi na i mara?Ma-ọbu ònye setiri eriri-ọtùtù n'elu ya?

6 N'èlu gini ka emere ka ukwu-ya nile bamie?Ma-ọbu ònye tọb͕ọrọ nkume nkuku-ya,

7 Mb͕e kpakpando ututu nētikọ nkpu ọṅù,Umu Chineke nile we tisie nkpu ọṅù ike?

8 Ma-ọbu ònye ji ibo-ọnu-uzọ mechibido oké osimiri,Mb͕e ọ waputara dika agāsi na ọ nēsi n'àkpà-nwa puta;

9 Mb͕e M'doro igwe-oji ka ọ buru uwe-ya,Na oké ọchichiri ka ọ buru ákwà-ọkiké-ya,

10 M'we kpawara ya ókèm,Tiye ihe-ntuchi na ibo-ọnu-uzọ,

11 Si, Rue ebe a ka i gābia, ma i gaghi-agabiga ya;N'ebe a ka agākwusi kwa npako nke ebili-miri-gi nile?

12 Site na nmalite ubọchi-gi ọ̀ di mb͕e i nyere ututu iwu,Me chi-ọbubọ ka ọ mara ọnọdu-ya;

13 Ka o we jide akuku nile nke uwa aka,Ewe si nime ya rurupu ndi nēmebe iwu?

14 Ọ nāb͕anwe onwe-ya dka urọ akàrà;Ha nēguzo kwa onwe-ha dika uwe:

15 Anēb͕ochi kwa ìhè-ha n'ebe ndi nēmebi iwu nọ,Anānyaji kwa ogwe-aka di elu.

16 Ì bàwo n'ebe-nsuputa nile nke oké osimiri?Ma-ọbu ì jeghariwo n'ebe michasiri emi nke ob͕u-miri?

17 Èkpugheworo gi ọnu-uzọ-ama nile nke ọnwu?Ma-ọbu ì nāhu ọnu-uzọ-ama nke onyinyo ọnwu?

18 Ì ghọtawo rue obosara uwa?Gosim, ma ọ buru na i nazuwo ya.

19 Òle ebe ọ di, bú uzọ ebe-obibi ìhè?Ọchichiri kwa, òle ebe ọ di, bú ọnọdu-ya;

20 Nke i gēwere ya je n'ókè-ala-ya,Nke i gāghọta kwa uzọ nile nke ulo-ya?

21 I mawo, n'ihi na mb͕e ahu ka anāmu gi,Ọnu-ọgugu ubọchi-gi ri-kwa-ra nne!

22 Ì bàwo n'ulo-nkwakọba nile nke snow,Ma-ọbu ì nāhu ulo-nkwakọba nile nke ákú-miri-igwe,

23 Nke M'b͕ochiworo nye mb͕e nkpà,Nye ubọchi ọ̀gù na agha?

24 Òle ebe ọ di, bú uzọ ebe anēkesa ìhè,Ebe anāb͕asa ifufe ọwuwa-anyanwu n'elu uwa?

25 Ònye waworo uzọ-miri nye iju-miri,Ma-ọbu uzọ nye àmùmà nke éb͕è-elu-igwe;

26 Ime ka miri zokwasi ala ebe ọ dighi onye ọ bula bi;Bú ọzara madu nēbighi nime ya;

27 Ime ka afọ ju nkpọnkpọ-ebe nke tọb͕ọrọ n'efu;Na ime ka o pue, bú npuputa ọhu nke ahihia ndu?

28 Miri-ozuzo, ọ̀ nwere nna?Ma-ọbu ònye muworo nkpuru igirigi?

29 N'àfọ onye ka ice nēsi puta?Hoar-frost nke elu-igwe kwa, ònye muworo ya?

30 N'ihe dika nkume ka miri nēzobe onwe-ha,Iru ob͕u-miri nāraru kwa araru.

31 Ì nēkekọta iru-utọ Pleiades,Ma-ọbu tọsa ihe-ọdudọ nile nke Orion?

32 Ì nēme ka Mazzaroth puta na mb͕e-ya?Ma-ọbu ì nēdu Bear na umu-ya?

33 Ì mawo ukpuru nile nke elu-igwe?Ma-ọbu ì nēdo ndozi-okwu-ya n'uwa?

34 Ì nēweli olu-gi elu rue igwe-oji,Ka njubiga miri we kpuchie gi?

35 Ì nēzipu àmùmà, ka ha we je,Si kwa gi, Le ayi?

36 Ònye tiyeworo amam-ihe n'akuku di nime?Ma-ọbu ònye nyeworo akọ-na-uche nghọta?

37 Ònye nāgu mbara-ígwé ọnu site n'amam-ihe?Ma-ọbu ònye nātọb͕ọ karama-akpukpọ nile nke elu-igwe ib͕apu miri-ha,

38 Mb͕e ájá nāghọ urọ,Mb͕e ọkpurukpu-ájá nile nārapara n'aru onwe-ha?

39 Ì nāchuru nne-ọdum anu-ndọb͕u?Ma-ọbu ì nēme ka afọ-iri-nri umu-ọdum ju,

40 Mb͕e ha nāmakpu n'ebe-obibi-ha,Nọdu kwa n'okwu-ọhia iche anu?

41 Ònye nēdoziri ugolo-ọma ihe-oriri-ya,Mb͕e umu-ya nētiku Chineke, Nāwaghari nēnweghi ihe-oriri?

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42