Job 24 IGBOB

1 Gini mere Onye puru ime ihe nile nējighi tukọba mb͕e?Gini mere ndi mara Ya nējighi hu ubọchi-Ya nile?

2 Ufọdu nēwezuga ókè-ala;Ha anapuwo kwa ìgwè aturu n'ike, we nāzù ha.

3 Ha nākpupu inyinya-ibu nke umu-nb͕ei,Ha nānara kwa ehi nke nwayi di-ya nwuru n'ihe-ibe.

4 Ha nēsi n'uzọ wezuga ndi-ob͕eye:Ndi ewedara n'ala nke uwa ezobekowo onwe-ha n'otù.

5 Le, dika inyinya-ibu-ọhia n'ọzaraKa ha nāpu ije ọlu-ha, nāchọsi nri-ọtita-ha ike;Ala ihe nādighi nēmere ha nri umu-ha gēri.

6 N'ọhia ka ha nile n'otù n'otù nwe nri-ha agwara agwa dika ihe-ubi;Ha nātutukọ kwa nkpuru-vine fọduru n'ubi-vine onye nēmebi iwu.

7 Ha nānọ ọnọdu-abali b͕ara ọtọ nēnweghi uwe,Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ha nwere n'oyi.

8 Oké miri-ozuzo nke ugwu nēde ha,Ma ebe ha nēnweghi ebe-nb͕abà, ha we b͕akua oké nkume.

9 Ufọdu nānapu nwa-nb͕ei n'ara n'ike,Nara kwa onye ewedara n'ala ihe-ibe:

10 Ha we nējeghari b͕ara ọtọ nēnweghi uwe,N'agu-ha ka ha nēbu kwa ùkwù-ọka;

11 N'etiti mb͕idi-ha ka ha nāpi manu;Ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile ha ka ha nāzọ ukwu, ma akpiri nākpọ ha nku.

12 Ha nēsi n'obodo ndikom sua udè,Nkpuru-obi ndi emeruworo aru nētiku Chineke:Ma Chineke adighi-agu ya n'ihe-nzuzu.

13 Ndi ahu nọ n'etiti ndi nānupu isi n'okpuru ìhè;Ha amataghi uzọ-ya nile,Ha ebighi kwa n'okporo-uzọ-ya nile.

14 Ìhè ututu ka ob͕u-madu ji bilie, o nēb͕u onye ewedara n'ala na ob͕eye;N'abali kwa ọ di ka onye-ori.

15 Ọzọ, anya onye nākwa iko nāriba chi-ojiji ama,Si, Ọ dighi anya ọ bula gēkirim:Ọ nēzobe iru-ya.

16 O gwupúwo ulo n'ọchichiri:N'ehihie ha nēmechibido onwe-ha uzọ;Ha amaghi ìhè.

17 N'ihi na ututu buru usu ha nile onyinyo ọnwu;N'ihi na ọ nāmata ihe-egwu nile nke onyinyo ọnwu.

18 Onye di nfe n'elu miri ka ọ bu;Anākọcha òkè-ha n'uwa:Ọ dighi-eche uzọ ubi-vine iru.

19 Ikpọ-nku na okpom-ọku nānapu miri snow n'ike:Otú a ka ala-mọ nēme ndi mehieworo.

20 Àkpà-nwa gēchezọ ya, aru-ya gātọ ikpuru utọ n'oriri;Agaghi-echeta kwa ya ọzọ:Agānyaji kwa ajọ omume dika osisi.

21 Ọ nēmeb͕u nwayi-àgà nke nādighi-amu nwa;Ọ dighi-eme kwa nwayi di-ya nwuru nma.

22 Ma O mewo ka ndi di ike nke-uku nādigide ndu site n'ike-Ya:O nēbili, ma ọ dighi onye kwere na ọ gādi ndu.

23 Chineke nēme ka ọ nọ na ntukwasi-obi, ọ nādabere kwa na ya;Ma anya-Ya dikwasi n'uzọ nile ha.

24 Ha di elu; na nwa mb͕e ha anọghi;Akwadawo kwa ha, chikọba ha dika madu nile,Ewe bipu ha dika ọnu-ọnu oko ọka.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42