Job 8 IGBOB

1 Bildad, bú onye Shua, we za, si,

2 Rùe ole mb͕e ka i ganēkwu ihe ndia?Rù kwa ole mb͕e ka okwu nile nke ọnu-gi gābu ifufe di ike?

3 Chineke, Ọ̀ neme ka ikpé b͕agọ ab͕agọ?Ma-ọbu Onye Nke puru ime ihe nile,Ọ̀ nēme ka ezi omume b͕agọ ab͕agọ?

4 Ọ buru na umu-gi emehiewo megide Ya,Ọ we zilaga ha n'aka nmehie-ha:

5 Ọ buru na gi onwe-gi achọsie Chineke ike,We riọ Onye Nke puru ime ihe nile aririọ-amara;

6 Ọ buru na onye di ọcha n'obi na onye ziri ezi ka i bu;N'ezie ub͕u a Ọ gētetara gi,Me ka ebe-obibi nke ezi omume-gi di n'udo.

7 Ọ bu ezie na nmalite-gi di ntà,Ma ikpe-azu-gi gēbù ibù nke-uku.

8 N'ihi na, biko, jua ọb͕o mbu,Dozie onwe-gi imata ihe ndi bu nna-ha gwuputara:

9 (N'ihi na nke nnyahuru ka ayi bu, ayi amaghi kwa ihe,N'ihi na onyinyo ka ubọchi-ayi nile bu n'elu uwa:)

10 Ndi ahu, hà agaghi-ezí gi ihe, gwa gi okwu,Si n'obi-ha weputa okwu?

11 Papyrus, Ò gētolite elu ma apiti adighi?Amì, ò gēbù ibù ma miri adighi?

12 Mb͕e ọ nọ n'ima akwukwọ ndu, mb͕e akēbighi ya,Ọ nēbu ahihia ọ bula uzọ akpọnwu.

13 Otú a ka okporo-uzọ ndi nile nēchezọ Chineke si di;Olile-anya nke onye emeruru emeru gāla n'iyì:

14 Onye agākpaji okwukwe efu ya,Ntukwasi-obi-ya bu kwa ulo ududo.

15 Ọ gādabere n'aru ulo-ya, ma ọ gaghi-eguzo:Ọ gējide ya, ma ọ gaghi-eguzosi ike.

16 Dika osisi ndu ka ọ di n'iru anyanwu,Ome-ya nēpusa n'ubi-ya ab͕ara ogige.

17 Nkpọrọgwu-ya nēkekọta onwe-ha n'aru obo nkume,Ọ nāhu ebe nkume anya.

18 Ọ buru na esi n'ebe-ya loda ya,Ọ gāgọnari kwa ya, si, Ahughm i.

19 Le, nka bu obi-utọ, nke uzọ-ya,Ma ndi ọzọ gēsi n'ájá pue.

20 Le, Chineke agaghi-aju onye zuru okè,Ọ gaghi-ejide kwa aka ndi nēme ihe ọjọ.

21 Rue mb͕e Ọ gēwere ichì-ọchì mejue ọnu-gi,Were kwa iti-nkpu mejue eb͕ub͕ere-ọnu-gi.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42