Job 15 IGBOB

1 Elifaz, bú onye Timan, we za, si,

2 Onye mara ihe, ọ̀ gēwere ọmuma-ihe nke bu nání ifufe za?Ọ̀ gēmeju kwa afọ-ya n'ifufe Iru-anyanwu?

3 Ọ̀ gēwere okwu nābaghi n'ihe ru uka,Ma-ọbu okwu nke ọ nējighi ha bara madu urù?

4 E, gi onwe-gi nēmebi egwu,Nēbilata kwa ntughari-uche n'iru Chineke.

5 N'ihi na ajọ omume-gi nēzi ọnu-gi ihe,I nārọputa kwa ire ndi-aghughọ.

6 Ọnu-gi nāma gi ikpe, ọ bughi mu onwem;Eb͕ub͕ere-ọnu-gi nāza kwa imegide gi.

7 Ì bu madu mbu amuru?Ma-ọbu àmuputara gi tutu ugwu adi?

8 Ọ̀ bu ìzù nzuzo Chineke ka i nēge nti?Ì nēbilata-kwa-ra onwe-gi amam-ihe?

9 Gini ka i mara nke ayi nāmaghi?Ì nāghọta ihe nke nādighi nime ayi?

10 Ma onye-isi-awọ ma onye kara nká nọ n'etiti ayi,Ndi ubọchi ndu-ha ka nke nna-gi nke-uku.

11 Ǹkasi-obi Chineke adikara gi ntà,Ha na okwu nke nēmeso gi nwayọ?

12 Gini mere obi-gi ji ebupu gi?Gini me-kwa-ra anya-gi abua ji atabi?

13 Na i nēchighari mọ-gi imegide Chineke,We me ka okwu nile di otú a si n'ọnu-gi puta.

14 Gini ka madu bu, na ọ gādi ọcha n'obi,Na ọ gābu kwa onye ezi omume, bú onye nwayi muru?

15 Le, ọbuná ndi nsọ Ya ka Ọ nādighi-atukwasi obi;Ọzọ, elu-igwe adighi ọcha n'anya-Ya.

16 Ònye-árú nke b͕aruru ab͕aru dika miri gēsi kwa aṅa di ọcha n'anya-Ya,Bú madu nke nāṅu ajọ omume dika miri?

17 M'gēkwuputara gi, gem nti;Ma nka ka m'huworo, m'gākọ kwa ya:

18 (Nke ndi mara ihe nēgosiSite na ndi bu nna-ha, ha ezoghi kwa ya;

19 Ndi ahu, náni ha, ka enyere ala,Ọ dighi kwa ọbìa gabigara n'etiti ha:)

20 Ubọchi nile nke onye nēmebi iwu ka onye ahu nāb͕ali,Bú ọnu-ọgugu arọ nke ezobeworo nye onye nēme ka madu ma jijiji.

21 Olu oké egwu di na nti-ya abua;Mb͕e ọ nọ n'udo ka onye nāpunara madu ihe gābiakute ya:

22 Ọ dighi-ekwe na ọ gēsi n'ochichiri lata,Onye anēche nche inye mma-agha ka ọ bu:

23 Onye nāwaghari ichọ nri ka ọ bu, ọ nāsi, Òle ebe ọ di?Ọ mawo na edoziwo ubochi ọchichiri n'aka-ya:

24 Ahuhu na nkpà nēme ka ọ tua egwu nke-uku;Ha nwere ike n'aru ya, dika eze nke nọ na njikere ibu agha:

25 N'ihi na o setipuwo aka-ya imegide Chineke,Ọ bu kwa imegide Onye Nke puru ime ihe nile ka ọ nēme onwe-ya onye di ike;

26 Ọ nēwere olu kwesiri ike b͕akwasi Ya,Were kwa ihe-nb͕ochi di ib͕idi nke ọta-ya:

27 Nihi na o werewo abuba-ya kpuchie iru-ya,Me ka abuba nke di arọ́ di n'úkwù-ya;

28 O we biri n'obodo ezopuru n'uwa,Nime ulo nke madu nādighi-ebi nime ha,Nke ejikereworo ighọ obo-ihe.

29 Ọ gāghi-abu ọgaranya, àkù-ya adighi-eguzosi kwa ike,Ọ dighi-eseti kwa ihe ha nwere n'uwa.

30 Ọ gaghi-esi n'ọchichiri wezuga onwe-ya;Ire-ọku gēme ka ome-ya kpọ nku,Ọ gēwezuga kwa onwe-ya site n'iku-ume nke ọnu-Ya.

31 Ka ọ ghara ikwere n'ihe-efu, eduhiewo ya:N'ihi na ihe-efu gābu ihe-nb͕anwe-ya.

32 Tutu ubọchi-ya erue ka agēmezu ya,Alaka-ya agaghi-adi ka ahihia ndu.

33 Ọ gēnwosisi nkpuru-vine-ya nke nāchaghi acha, dika osisi vine,Ọ gātuda kwa okoko-osisi-ya, dika osisi olive.

34 N'ihi na nzukọ nke onye emeruru emeru gābu ndi nāpughi imu nwa,Ọku gēripia ulo-ikwū nile nke ndi-ngo.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42