9 Biko, cheta na dika urọ ka I kpuworom;Ì gēme kwa ka m'laghachi n'ájá?
10 Ọ̀ bughi dika miri-ara ka I nāwusim,Me ka m'raru araru dika cheese?
11 Akpukpọ-aru na anu-aru ka I yikwasirim,Were kwa ọkpukpu na akwara kpam dika ákwà.
12 Ndu na ebere ka I meworo ka m'nwe,Nlekọta-gi edebewo kwa mọm.
13 Ma I zoro ihe ndia n'obi-Gi;Amawom na nka di n'aka-Gi:
14 Ọ buru na emehiewom, I nēlezikwam anya,I gaghi-agupukwam n'ajọ omumem.
15 Ọ buru na emebiwom iwu, ahuhu dirim;Ọ buru kwa na abum onye ezi omume, m'gaghi-eweli isim elu;Ebe nlelìm juworom afọ,Ya na ilekwasi nwedam anya.