13 N'aka-Ya ka amam-ihe na idi-ike di;Ọ nwere ndum-ọdu na nghọta.
14 Le, Ọ nākwada ihe, agaghi-ewu kwa ya ọzọ;Ọ nēmechibido madu uzọ, agaghi-emeghe kwa ya.
15 Le, Ọ nēb͕ochi miri, ha takọrọ;Ọzọ, ọ nēzipu ha, ha we kpùe uwa iru.
16 N'aka-Ya ka ike na nzube-ihe di;O nwere onye nēmehie n'amaghi-ama na onye nēme ka madu mehie n'amaghi-ama.
17 Ọ nēme ka ndi nādu ọdu la dika onye akwatara ihe-ya n'agha,Ọ nēme kwa ndi-ikpe ka ha ghọ ndi-nzuzu.
18 Ab͕u ndi-eze kere ka Ọ tọpuworo,We ke ihe-ọkiké n'úkwù-ha.
19 Ọ nēme ka ndi-nchu-àjà la dika onye akwatara ihe-ya nagha,Ndi nādigide ka Ọ nēme kwa ka ha kpùe iru.