17 Ọ nēme ka ndi nādu ọdu la dika onye akwatara ihe-ya n'agha,Ọ nēme kwa ndi-ikpe ka ha ghọ ndi-nzuzu.
18 Ab͕u ndi-eze kere ka Ọ tọpuworo,We ke ihe-ọkiké n'úkwù-ha.
19 Ọ nēme ka ndi-nchu-àjà la dika onye akwatara ihe-ya nagha,Ndi nādigide ka Ọ nēme kwa ka ha kpùe iru.
20 Ọ nēwezuga okwu eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi kwesiri ntukwasi-obi,Ezi uche nke ndi-okenye ka Ọ nēwepu kwa.
21 Ọ nāwusa nleda n'aru ndi amara aha-ha,Akpukpọ-úkwù nke ndi di ike ka Ọ kpọpu-kwa-ra.
22 Ọ nēsi n'ọchichiri kpughepu ihe di omimi,We me ka onyinyo ọnwu puta ìhè.
23 Ọ nēme ka mba di uku, Ọ nēme kwa ka ha la n'iyì:Ọ nāb͕asa mba, nēdu kwa ha.