21 Ọ nāwusa nleda n'aru ndi amara aha-ha,Akpukpọ-úkwù nke ndi di ike ka Ọ kpọpu-kwa-ra.
22 Ọ nēsi n'ọchichiri kpughepu ihe di omimi,We me ka onyinyo ọnwu puta ìhè.
23 Ọ nēme ka mba di uku, Ọ nēme kwa ka ha la n'iyì:Ọ nāb͕asa mba, nēdu kwa ha.
24 Ọ nēwezuga obi ndi-isi nke ndi uwa,We me ka ha waghari n'ebe tọb͕ọrọ n'efu ebe uzọ nādighi.
25 Ha nāsọghari ìsì n'ọchichiri nēnweghi ìhè,O we me ka ha kpafue dika onye ṅubigaworo manya ókè.