21 Me ka ọbu-aka-Gi dipu n'arum n'ebe di anya;Ka oké ujọ-Gi ghara kwa ime ka m'tua egwu nke-uku.
22 Gi kpọ kwa òkù, mu onwem gāza kwa;Ma-ọbu ka m'kwue, I we zam.
23 Àjọ omume na nmehie m'nwere di ole?Me ka m'mara njehiem na nmehiem.
24 N'ìhi gini ka I nēzo iru-Gi,Nēchè kwa na mu bu onye-iro n'ebe I nọ?
25 Ì gēme ka akwukwọ osisi nke ifufe nēfepu ma jijiji?Ma-ọbu Ì gāchu ahihia ọ̄ka kpọrọ akpọ?
26 N'ihi na I nēde ihe di ilu n'akwukwọ megidem,I nēme kwa ka m'nweta ajọ omume nile m'mere n'okorọbiam:
27 I nētiye kwa ukwum abua n'ọtọsi, nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya;I nākpa Onwe-gi ókè buruburu ọbu-ukwum: