3 Ma mu onwem, Onye Nke puru ime ihe nile ka m'gāgwa okwu,Ọ nātọkwam utọ isoro Chineke ru uka.
4 Ma otú ọ di, unu onwe-unu bu ndi nētekpu madu okwu-ugha dika ihe-ntekpu,Ndi-dibia efu ka unu nile bu.
5 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na unu ab͕asi nkiti!Ọ we ghọro unu amam-ihe.
6 Biko, nurunu iru-ukam,Ṅa-kwa-nu nti n'ikpe-ọnu nile nke eb͕ub͕ere-ọnum.
7 Ọ̀ bu Chineke ka unu gēkwuru okwu ajọ omume?Ọ̀ bu Ya ka unu gēkwu-kwa-ra okwu aghughọ?
8 Ọ̀ bu Ya ka unu gāhu iru-ọma?Ọ̀ bu Chineke ka unu gāluru ọ̀gù?
9 Ọ̀ di nma ka O gwuputa ala unu?Ma-ọbu dika madu si akwa madu emò, ọ̀ bu otú a ka unu gākwa Ya emò?