5 Ebe ihe akara àkà ka ubọchi-ya nile bu, ọnu-ọgugu nke ọnwa-ya nile di n'aka-Gi,I mewo ókè-ya, ọ gaghi-agabiga kwa ya;
6 Lepu ya anya, ka o we kwusi,Rue mb͕e ubochi-ya gātọ ya utọ, dika onye egoro ọlu.
7 N'ihi na olile-anya diri osisi na ọ gēpute ọzọ, ma eb͕utue ya,Na ome-ya agaghi-akwusi kwa.
8 Ọ buru na nkpọrọgwu-ya eme ochie n'ala,Ogwe-ya anwu kwa n'ájá;
9 Site n'ísì miri ọ gāma akwukwọ,Wa kwa alaka dika ihe akuru aku.
10 Ma onye di ike gānwu, ike gāgwu kwa ya:Madu we kubìe ume, òle ebe ọ nọ kwa?
11 Miri esiwo n'oké osimiri la,Osimiri we tasia, takọrọ;