13 Na i nēchighari mọ-gi imegide Chineke,We me ka okwu nile di otú a si n'ọnu-gi puta.
14 Gini ka madu bu, na ọ gādi ọcha n'obi,Na ọ gābu kwa onye ezi omume, bú onye nwayi muru?
15 Le, ọbuná ndi nsọ Ya ka Ọ nādighi-atukwasi obi;Ọzọ, elu-igwe adighi ọcha n'anya-Ya.
16 Ònye-árú nke b͕aruru ab͕aru dika miri gēsi kwa aṅa di ọcha n'anya-Ya,Bú madu nke nāṅu ajọ omume dika miri?
17 M'gēkwuputara gi, gem nti;Ma nka ka m'huworo, m'gākọ kwa ya:
18 (Nke ndi mara ihe nēgosiSite na ndi bu nna-ha, ha ezoghi kwa ya;
19 Ndi ahu, náni ha, ka enyere ala,Ọ dighi kwa ọbìa gabigara n'etiti ha:)