17 M'gēkwuputara gi, gem nti;Ma nka ka m'huworo, m'gākọ kwa ya:
18 (Nke ndi mara ihe nēgosiSite na ndi bu nna-ha, ha ezoghi kwa ya;
19 Ndi ahu, náni ha, ka enyere ala,Ọ dighi kwa ọbìa gabigara n'etiti ha:)
20 Ubọchi nile nke onye nēmebi iwu ka onye ahu nāb͕ali,Bú ọnu-ọgugu arọ nke ezobeworo nye onye nēme ka madu ma jijiji.
21 Olu oké egwu di na nti-ya abua;Mb͕e ọ nọ n'udo ka onye nāpunara madu ihe gābiakute ya:
22 Ọ dighi-ekwe na ọ gēsi n'ochichiri lata,Onye anēche nche inye mma-agha ka ọ bu:
23 Onye nāwaghari ichọ nri ka ọ bu, ọ nāsi, Òle ebe ọ di?Ọ mawo na edoziwo ubochi ọchichiri n'aka-ya: