15 Ákwà-nkpe ka m'dukọtaworo n'elu akpukpọ-arum,Turughari mpim n'ájá.
16 Irum nācha ọbara-ọbara site n'ikwa-ákwá,Na mbubere-anyam ka onyinyo ọnwu di kwa;
17 Ọ bughi n'ihi na ihe-ike di n'ọbu-akam,Ekperem di kwa ọcha.
18 Ala, ekpuchila ọbaram,Ka ọnọdu ghara idiri iti-nkpum.
19 Ọbuná ub͕u a, le, n'elu-igwe ka Onye-àmàm nọ,Onye nēkwurum nọ kwa n'ebe di elu.
20 Ndi-eyìm bu ndi nākwam emò:Ma ọ bu n'ebe Chineke nọ ka anyam nātusisi anya-miri;
21 Ka otù onye we so Chineke ruara madu uka,Dika nwa nke madu si aruara madu-ibe-ya uka.