16 Irum nācha ọbara-ọbara site n'ikwa-ákwá,Na mbubere-anyam ka onyinyo ọnwu di kwa;
17 Ọ bughi n'ihi na ihe-ike di n'ọbu-akam,Ekperem di kwa ọcha.
18 Ala, ekpuchila ọbaram,Ka ọnọdu ghara idiri iti-nkpum.
19 Ọbuná ub͕u a, le, n'elu-igwe ka Onye-àmàm nọ,Onye nēkwurum nọ kwa n'ebe di elu.
20 Ndi-eyìm bu ndi nākwam emò:Ma ọ bu n'ebe Chineke nọ ka anyam nātusisi anya-miri;
21 Ka otù onye we so Chineke ruara madu uka,Dika nwa nke madu si aruara madu-ibe-ya uka.
22 N'ihi na arọ ole-na-ole gābia,M'we je n'uzọ m'gaghi-alaghachi.