1 Bildad, bú onye Shua, we za, si,
2 Rùe ole mb͕e unu ganēsiri okwu ọnyà?Ghọtanu, ma emesia ayi gēkwu.
3 Gini mere aguworo ayi ka anumanu?Ayi aghọwo ndi ruru árú n'anya-unu.
4 Ọ nādọka onwe-ya n'iwe-ya.Àgārapu uwa n'ihi gi?Ma-ọbu àgākwapu oké nkume n'ọnọdu-ya?
5 Ọzọ, agēmenyu ìhè nke ndi nēmebi iwu,Ọ dighi kwa ire-ọku nke ọku-ya gēnwu.
6 Ìhè aghọwo ọchichiri n'ulo-ikwū-ya,Agēmenyu kwa oriọna-ya n'elu ya.
7 Agākpagide nzọ-ukwu nile nke ume-ya,Ndum-ọdu-ya gātuda kwa ya.