14 Agādọpusi ya ike n'ulo-ikwū-ya, bú ihe-ntukwasi-obi-ya;Agēme ka ọ zọrọ ukwu gakuru eze nke ihe-egwu nile.
15 Ihe nābughi nke ya gēbi n'ulo-ikwū-ya:Agēfesa brimstone n'elu ebe-obibi-ya.
16 Nkpọrọgwu-ya gākpọ nku n'okpuru,Agēbipu kwa alaka-ya n'elu.
17 Ncheta-ya alawo n'iyì pua n'uwa,Ọ dighi kwa aha ọ gēnwe n'èzí.
18 Agākwapu ya n'ihè ba n'ọchichiri,Agēme kwa ka o si n'elu-uwa dum madu bi waghari.
19 Ọ dighi umu, ọ dighi kwa umu umu, ọ gēnwe n'etiti ndi-ya,Ọ dighi kwa onye fọduru n'ọnọdu-ọbìa-ya nile.
20 Ibobo bayere ubọchi-ya anwuwo ndi bi n'akuku Ọdida-anyanwu n'aru,Ndi bi n'akuku Iru-anyanwu atuwo kwa oké ujọ.