3 Gini mere aguworo ayi ka anumanu?Ayi aghọwo ndi ruru árú n'anya-unu.
4 Ọ nādọka onwe-ya n'iwe-ya.Àgārapu uwa n'ihi gi?Ma-ọbu àgākwapu oké nkume n'ọnọdu-ya?
5 Ọzọ, agēmenyu ìhè nke ndi nēmebi iwu,Ọ dighi kwa ire-ọku nke ọku-ya gēnwu.
6 Ìhè aghọwo ọchichiri n'ulo-ikwū-ya,Agēmenyu kwa oriọna-ya n'elu ya.
7 Agākpagide nzọ-ukwu nile nke ume-ya,Ndum-ọdu-ya gātuda kwa ya.
8 N'ihi na eji ukwu-ya abua ziga ya n'ub͕u eji eb͕u anu,Ọ nējeghari kwa n'elu ihe-ntuhi.
9 Ib͕udu gādakwasi ya n'ikiri-ukwu,Ọnyà gāma ya.