8 N'ihi na eji ukwu-ya abua ziga ya n'ub͕u eji eb͕u anu,Ọ nējeghari kwa n'elu ihe-ntuhi.
9 Ib͕udu gādakwasi ya n'ikiri-ukwu,Ọnyà gāma ya.
10 Ezobeworo ya udọ̀ n'ala,Na ihe iji nwude ya n'elu uzọ.
11 Ihe-egwu emewo ka ọ tua egwu nke-uku buruburu,Ha we chugharia ya n'ukwu-ya.
12 Agu ganāgu ume-ya,Edoziwo kwa nhuju-anya n'akuku-ya.
13 Ọ gēripia ihe di n'akpukpọ-aru-ya,Ọkpara ọnwu gēripia ihe nile di ya n'aru.
14 Agādọpusi ya ike n'ulo-ikwū-ya, bú ihe-ntukwasi-obi-ya;Agēme ka ọ zọrọ ukwu gakuru eze nke ihe-egwu nile.