11 O me ka iwe-Ya di ọku imegidem,Ọ guaram Onwe-ya dika ndi nēmegide Ya.
12 Usu-Ya nile ndi nāpunara madu ihe nābiakọta, tulie uzọ-ha imegidem,Ma kwa ulo-ikwū-ha buruburu ulo-ikwūm.
13 O mewo ka umu-nnem nọpurum n'ebe di anya,Ndi maworom we ghọ nání ndi ala ọzọ n'ebe m'nọ.
14 Ndi-ab͕ata-obim akwusiwo,Ndi m'mara echezọwokwam.
15 Ndi nọ n'ulom dika ọbìa na ndi-orum nwayi nāgum n'onye ala ọzọ:Onye anāmataghi ka m'ghọworo n'anya-ha.
16 Akpọwom arùm òkù, ma ọ dighi-azam,Anameji ọnum riọ ya aririọ-amara.
17 Iku-umem aghọwo iku-ume onye nābughi di-ya n'ebe nwunyem nọ,Ariọwokwam umu afọ nnem aririọ-amara.