24 Ma asi na eji pen ígwè na òpùKa ha n'oké nkume rue mb͕e ebighi-ebi!
25 Ma mu onwem amawo na Onye-nb͕aputam di ndu,Na O gēbili kwa ọtọ n'elu ájá n'ikpe-azu:
26 Mb͕e emebisi-kwa-ra akpukpọ-arum nka,Ọ bu na m'gēsi n'anu-arum hu Chineke:
27 Onye mu onwem gāhuru onwem,Anyam abua gāhu kwa Ya, Ọ bughi kwa onye ala ọzọ.Akurum abua agwusiwo n'imem.
28 Ọ buru na unu asi, Àyi gēsi aṅa chu ya?Ma achọtawo nkpọrọgwu okwu nimem;