1 Zofa, bú onye Neama, we za, si,
2 N'ihi nka ka èchìchèm nāzaghachim,Ọbuná n'ihi ime-ngwam nke di nimem.
3 Anuwom ọdidọ-aka-na-nti nke nētiyem n'ọnọdu-ihere,Mọ nke nghọtam nāzakwam.
4 Ì mawo nka site na mb͕e ochie,Site na mb͕e edoro madu n'elu uwa,
5 Na iti-nkpu-ọǹù nke ndi nēmebi iwu di nkpunkpu,Na ọṅù nke onye emeruru emeru nādi kwa rue mb͕e ntabi-anya?
6 Ọ buru na nbuli-ya arigorue elu-igwe,Isi-ya ewe metu igwe-oji;