11 Ọkpukpu-ya nile juputara n'ume okorọbia-ya,Ma o gēso ya dina n'elu ájá.
12 Ọ buru na ihe ọjọ atọ utọ n'ọnu-ya,Ọ buru na o zobe ya n'okpuru ire-ya;
13 Ọ buru na o nwe ọmiko n'aru ya, we ghara irapu ya,Kama ọ nēb͕ochi ya nokpo-ọnu-ya;
14 Nri-ya nke di na ngiri-afọ-ya ab͕anwewo,Ọ bu òlùlù aju-ala n'ime-ya.
15 O lodawo àkù, we b͕oputa ya:Chineke gēsi n'afọ-ya napu ya àkù ahu.
16 Nsi aju-ala ka ọ gāmiri:Ire agwọ gēb͕u ya.
17 Ọ gaghi-ele miri-iyi anya,Bú osimiri miri-iyi nke manu-aṅu na miri-ara-ehi raru araru.