17 Ọ gaghi-ele miri-iyi anya,Bú osimiri miri-iyi nke manu-aṅu na miri-ara-ehi raru araru.
18 Ọ nēnyeghachi ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inwe, ọ gaghi-eleda ya;Dika àkù nke ihe-nb͕anwe-ya si di, ọ gaghi-aṅuri ọṅu otú a.
19 N'ihi na ọ zopiawo ndi-ob͕eye, rapu kwa ha;Ọ napuwo ulo n'ike, ọ gaghi-ewu kwa ya.
20 N'ihi na ọ dighi-ama udo n'afọ-ya,Ya mere ọ gaghi-eji ihe-ya anāchọsi ike wepuga onwe-ya.
21 Ọ dighi ihe fọduru nke ọ nērighi;N'ihi ya ọdi-nma-ya agaghi-adi ike.
22 N'ojuju nke ozùzù-ya nkpà nākpà ya:Aka onye ọ bula nke nọ n'ọnọdu ọjọ gābiakwasi ya.
23 Ka o rue, n'iriju afọ-ya,Na Chineke gēzitere ya idi-ọku nke iwe-Ya,Na Ọ gēme kwa ka o zokwasi ya dika miri-ozuzo nime nri-ya.