4 Ì mawo nka site na mb͕e ochie,Site na mb͕e edoro madu n'elu uwa,
5 Na iti-nkpu-ọǹù nke ndi nēmebi iwu di nkpunkpu,Na ọṅù nke onye emeruru emeru nādi kwa rue mb͕e ntabi-anya?
6 Ọ buru na nbuli-ya arigorue elu-igwe,Isi-ya ewe metu igwe-oji;
7 Dika ǹsí-ya ka ọ gāla n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi:Ndi huworo ya gāsi, Òle ebe ọ nọ?
8 Dika nrọ ka ọ gēfelaga, agaghi-achọta kwa ya:Agēme kwa ka o fepu dika ọhù abali.
9 Anya ahuwo ya, ma ọ gaghi-ahu kwa ya ọzọ;Ọnọdu-ya agaghi-ekiri kwa ya ọzọ.
10 Umu-ya gāchọ iru-oma ndi-ob͕eye,Aka-ya abua gēnyeghachi kwa àkù-ya.