7 Dika ǹsí-ya ka ọ gāla n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi:Ndi huworo ya gāsi, Òle ebe ọ nọ?
8 Dika nrọ ka ọ gēfelaga, agaghi-achọta kwa ya:Agēme kwa ka o fepu dika ọhù abali.
9 Anya ahuwo ya, ma ọ gaghi-ahu kwa ya ọzọ;Ọnọdu-ya agaghi-ekiri kwa ya ọzọ.
10 Umu-ya gāchọ iru-oma ndi-ob͕eye,Aka-ya abua gēnyeghachi kwa àkù-ya.
11 Ọkpukpu-ya nile juputara n'ume okorọbia-ya,Ma o gēso ya dina n'elu ájá.
12 Ọ buru na ihe ọjọ atọ utọ n'ọnu-ya,Ọ buru na o zobe ya n'okpuru ire-ya;
13 Ọ buru na o nwe ọmiko n'aru ya, we ghara irapu ya,Kama ọ nēb͕ochi ya nokpo-ọnu-ya;