11 Ha nēzipu umu-ha nāṅu ara dika ìgwè ewu na aturu,Umu-ha nēte kwa egwú.
12 Ha nēweli olu-ha n'egwú-otiti na ubọ-akwara,Nāṅuri kwa ọǹu n'olu ọ̀jà.
13 Ha nāla ubọchi nile ha n'iyì n'ọdi-nma,Ma n'otù ntabi-anya ha nārida n'ala-mọ.
14 Ha we si Chineke, Si n'ebe ayi nọ wezuga Onwe-gi;N'ihi na ọmuma uzọ-Gi nile atọghi ayi utọ.
15 Gini bu Onye Nke puru ime ihe nile, nke ayi gābu orù-Ya?Gini ka ọ gābara ayi, ma ayi riọ Ya aririọ?
16 Le, ọ bughi n'aka-ha ka ọdi-nma-ha di:Ndum-ọdu nke ndi nēmebi iwu di anya n'ebe m'nọ.
17 Ùb͕ò ole ka anēmenyu oriọna ndi nēmebi iwu?Ùb͕ò ole ka nhuju-anya-ha nābiakwasi ha?Ùb͕ò ole ka Chineke nēkesa ihe-nb͕u n'iwe-Ya?