16 Le, ọ bughi n'aka-ha ka ọdi-nma-ha di:Ndum-ọdu nke ndi nēmebi iwu di anya n'ebe m'nọ.
17 Ùb͕ò ole ka anēmenyu oriọna ndi nēmebi iwu?Ùb͕ò ole ka nhuju-anya-ha nābiakwasi ha?Ùb͕ò ole ka Chineke nēkesa ihe-nb͕u n'iwe-Ya?
18 Ùb͕ò ole ka ha di ka ahihia-ọka n'iru ifufe,Na dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēzupu dika onye-ori?
19 Unu nāsi, Chineke nēzobere umu-ya ajọ ihe-ya.Ka Ọ kwughachi onye ahu n'onwe-ya, ka o we mara ya.
20 Ka anya-ya abua hu nbibi-ya,Ya ṅua ufọdu nime ọnuma nke Onye Nke puru ime ihe nile.
21 N'ihi na ìhe ulo-ya gēsi aṅa tọ ya utọ mb͕e ọ nwusiri,Mb͕e ekepusiri ọnu-ọgugu ọnwa-ya nile n'etiti?
22 Ọ̀ di onye gēzí Chineke ọmuma-ihe? Ebe Ya onwe-ya nēkpe ndi di elu ikpe.