19 Unu nāsi, Chineke nēzobere umu-ya ajọ ihe-ya.Ka Ọ kwughachi onye ahu n'onwe-ya, ka o we mara ya.
20 Ka anya-ya abua hu nbibi-ya,Ya ṅua ufọdu nime ọnuma nke Onye Nke puru ime ihe nile.
21 N'ihi na ìhe ulo-ya gēsi aṅa tọ ya utọ mb͕e ọ nwusiri,Mb͕e ekepusiri ọnu-ọgugu ọnwa-ya nile n'etiti?
22 Ọ̀ di onye gēzí Chineke ọmuma-ihe? Ebe Ya onwe-ya nēkpe ndi di elu ikpe.
23 Otù onye nānwu n'ume-ya zuru okè,Mb͕e ọ nānọzu jū na n'udo:
24 Ihe-ya nile juputara na miri-ara-ehi,Umi ọkpukpu-ya nile edewo kwa miri.
25 Onye ọzọ nānwu n'ilu nkpuru-obi,Ọ dighi kwa mb͕e o riri ezi ihe.