22 Ọ̀ di onye gēzí Chineke ọmuma-ihe? Ebe Ya onwe-ya nēkpe ndi di elu ikpe.
23 Otù onye nānwu n'ume-ya zuru okè,Mb͕e ọ nānọzu jū na n'udo:
24 Ihe-ya nile juputara na miri-ara-ehi,Umi ọkpukpu-ya nile edewo kwa miri.
25 Onye ọzọ nānwu n'ilu nkpuru-obi,Ọ dighi kwa mb͕e o riri ezi ihe.
26 Ha abua n'otù, n'elu ájá ka ha nēdinakọ,Ikpuru nēkpuchi kwa ha.
27 Le, amawom èchìchè-unu,Na nzube nile unu ji megidem ihe-ike.
28 N'ihi na unu nāsi, Òle ebe ulo onye-isi di?Òle ebe ulo-ikwū nke ebe-obibi ndi nēmebi iwu di kwa?