24 Ihe-ya nile juputara na miri-ara-ehi,Umi ọkpukpu-ya nile edewo kwa miri.
25 Onye ọzọ nānwu n'ilu nkpuru-obi,Ọ dighi kwa mb͕e o riri ezi ihe.
26 Ha abua n'otù, n'elu ájá ka ha nēdinakọ,Ikpuru nēkpuchi kwa ha.
27 Le, amawom èchìchè-unu,Na nzube nile unu ji megidem ihe-ike.
28 N'ihi na unu nāsi, Òle ebe ulo onye-isi di?Òle ebe ulo-ikwū nke ebe-obibi ndi nēmebi iwu di kwa?
29 Ùnu ajughi ndi nāgabiga n'uzọ?Ùnu amaghi kwa ihe-iriba-ama-ha?
30 Na ọ bu rue ubọchi nhuju-anya ka anēb͕ochi onye ọjọ?Na ọ bu rue ubọchi ọnuma ka anēdupu ha?