3 Nagidenum, mu onwem gēkwu kwa okwu;Ma mb͕e m'kwusiri okwu, i gāchì ọchì.
4 Mu onwem, ọ̀ bu madu ka m'nātamuru ntamu?Ma ọ buru na ọ di otú a, gini mere mọm nējighi arapu ibu ihe nādighi-ewe iwe ọsọsọ?
5 Chenum iru, ka ibobo nwu kwa unu n'aru,Tukwasi-kwa-nu aka n'ọnu.
6 Ọ buru kwa na echetam, anam-ama jijiji,Ima-jijiji ejidewo kwa anu-arum.
7 Gini mere ndi nēmebi iwu nādi ndu,Ghọ okenye, nābu kwa ndi di ike bu dìnkpà?
8 Emewo ka nkpuru-ha so ha guzosie ike n'iru ha,Emewo kwa ka umu nke putara n'aru-ha guzosie ike n'anya-ha.
9 Ulo-ha di n'udo pua n'oké egwu,Nkpa-n'aka Chineke adighi kwa n'aru ha.