7 Gini mere ndi nēmebi iwu nādi ndu,Ghọ okenye, nābu kwa ndi di ike bu dìnkpà?
8 Emewo ka nkpuru-ha so ha guzosie ike n'iru ha,Emewo kwa ka umu nke putara n'aru-ha guzosie ike n'anya-ha.
9 Ulo-ha di n'udo pua n'oké egwu,Nkpa-n'aka Chineke adighi kwa n'aru ha.
10 Oke-ehi-ya nāb͕à nne-ehi, ọ dighi-ab͕ahie;Nne-ehi-ya nāmu nwa, ọ dighi-ekwo ime.
11 Ha nēzipu umu-ha nāṅu ara dika ìgwè ewu na aturu,Umu-ha nēte kwa egwú.
12 Ha nēweli olu-ha n'egwú-otiti na ubọ-akwara,Nāṅuri kwa ọǹu n'olu ọ̀jà.
13 Ha nāla ubọchi nile ha n'iyì n'ọdi-nma,Ma n'otù ntabi-anya ha nārida n'ala-mọ.